ABÙ ỌMA 103:8-12
ABÙ ỌMA 103:8-12 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
ONYENWE ANYị nwere obi ọmịiko na-emekwa amara. Ọ dịghị ewe iwe ọsịịsọ, o jupụtara nʼịhụnanya. Iwe ya anaghị adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụghị oge niile ka ọ na-anọgide na-ata mmadụ ụta; ọ bụghị dịka mmehie anyị si dị ka ọ na-emeso anyị, ọ dịghị akwụghachi anyị dịka ajọ omume anyị si dị. Nʼihi na dịka eluigwe si dị elu karịa ụwa, otu a ka ịhụnanya ya si dị ukwuu nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ. Dịka ọwụwa anyanwụ si dị anya, site nʼọdịda anyanwụ, otu a ka o sirila mee ka mmehie anyị niile dịrị anya site nʼebe anyị nọ.
ABÙ ỌMA 103:8-12 Bible Nso (IGBOB)
Jehova nwere obi-ebere, nēme kwa amara, Ọ dighi-ewe iwe ọsọsọ, Ọ nāba kwa uba n'ebere. Ọ bughi rue mgbe nile ka Ọ ganēse okwu; Ọ bughi kwa rue mb͕e ebighi-ebi ka Ọ ganēdebe iwe. Ọ bughi dika nmehie nile ayi si di ka O meworo ayi, Ọ bughi kwa dika ajọ omume nile ayi si di ka O mesoworo ayi. N'ihi na dika idi-elu nke elu-igwe si di n'elu uwa, Otú a ka ebere-Ya di ike n'aru ndi nātu egwu Ya. Dika Iru-anyanwu si di anya n'Ọdida-anyanwu, Otú a ka O meworo ka njehie nile ayi di anya n'ebe ayi nọ.