ABÙ ỌMA 103:19-22
ABÙ ỌMA 103:19-22 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
ONYENWE ANYị emeela ka ocheeze ya guzosie ike nʼeluigwe, alaeze ya na-achị ihe niile. Toonu ONYENWE ANYị, unu ndị mmụọ ozi ya, unu ndị dị ike ndị na-eme ihe ọ chọrọ, na-erubere okwu ya isi. Toonu ONYENWE ANYị unu usuu ndị agha ya niile; unu ndị na-ejere ya ozi, ndị na-eme uche ya. Toonu ONYENWE ANYị, ọrụ aka ya niile nʼebe ọbụla ọ na-achị.
ABÙ ỌMA 103:19-22 Bible Nso (IGBOB)
Jehova emewo ka oche-eze-Ya guzosie ike n'elu-igwe; Ala-eze-Ya nāchi kwa ihe nile. Gọzienu Jehova, ndi-mọ-ozi-Ya, Unu ndi-dike di ike, ndi nēme okwu-Ya, N'ige nti olu nke okwu-Ya. Gọzienu Jehova, usu-ndi-agha-Ya nile; Unu ndi nējere Ya ozi, ndi nēme ihe nātọ Ya utọ. Gọzienu Jehova, unu ọlu-Ya nile, N'ebe nile Ọ nāchi: Gọzie Jehova, nkpuru-obim.