ABÙ ỌMA 101:1-8
ABÙ ỌMA 101:1-8 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Aga m abụ abụ banyere ịhụnanya gị na ikpe gị ziri ezi; o ONYENWE ANYị, ọ bụ gị ka m ga-abụku abụ otuto. Aga m enwe uche ị hụ na m biri ndụ na-enweghị ịta ụta ọbụla, olee mgbe ị ga-abịakwute m? Aga m ejikwa obi nke a na-agaghị ata ụta ọbụla jegharịa nʼime ụlọ m. Agaghị m edo ihe jọgburu onwe ya nʼihu m. Ana m akpọ ọrụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi asị. Agaghị m enwekwa oke nʼime ya. Ndị obi ha gbagọrọ agbagọ agaghị anọ m nso. Agakwaghị m etinye aka nʼọrụ ọjọọ ọbụla. Onye ọbụla na-ekwulu onye agbataobi ya na nzuzo, onye ahụ ka m ga-emechi ọnụ; agaghị m anabata onye ọbụla dị mpako ma nwee obi nganga. Aga m elekwasị ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼala a anya, ka mụ na ha biri; onye ahụ na-eje ije na-enweghị ịta ụta ọbụla ga-ejere m ozi. Onye ọbụla na-aghọ aghụghọ agaghị ebi nʼụlọ m; onye ọbụla na-ekwu okwu ụgha agaghị eguzokwa nʼihu m. Ụtụtụ niile ka m na-eme ka ha dere duu bụ ndị ajọ omume niile nọ nʼala a; Aga m ebipụ ndị niile na-eme ajọ ihe site nʼobodo ONYENWE ANYị.
ABÙ ỌMA 101:1-8 Bible Nso (IGBOB)
Ebere na ezi ikpé ka M'gābù n'abù: Gi, Jehova, ka m'gabùku abù ọma. M'gēnwe uche n'uzọ zuru okè: Òle mb͕e I gābiakutem? M'gējeghari n'etiti ulom n'izu-okè nke obim. M'gaghi-edo ihe jọb͕uru onwe-ya n'irum: Akpọwom ọlu nke ndi nējehie asì; Ọ gaghi-arapra n'arum. Obi b͕agọro ab͕agọ gēsi n'ebe m'nọ wezuga onwe-ya: Ọ dighi onye ọjọ m'gāmara. Onye nēkpè madu-ibe-ya ikpè na nzuzo, onye ahu ka m'gēkpochapu: Onye nwere anya npako na obi di nganga, onye ahu ka m'nāpughi inagide. Anyam abua di n'aru ndi kwesiri ntukwasi-obi n'ala, ka mu na ha we biri: Onye nēje ije n'uzọ zuru okè, onye ahu gējerem ozi. Onye nālu ọlu aghughọ agaghi-ebi n'etiti ulom: Onye nēkwu okwu-ugha agaghi-eguzosi ike n'iru anyam. Kwa-ututu ka m'gēkpochapu ndi nile nēmebi iwu n'ala; Isi n'obodo Jehova kpochapu ndi nile nālu ajọ ihe.