ABÙ ỌMA 101:1-8
ABÙ ỌMA 101:1-8 IGBOB
Ebere na ezi ikpé ka M'gābù n'abù: Gi, Jehova, ka m'gabùku abù ọma. M'gēnwe uche n'uzọ zuru okè: Òle mb͕e I gābiakutem? M'gējeghari n'etiti ulom n'izu-okè nke obim. M'gaghi-edo ihe jọb͕uru onwe-ya n'irum: Akpọwom ọlu nke ndi nējehie asì; Ọ gaghi-arapra n'arum. Obi b͕agọro ab͕agọ gēsi n'ebe m'nọ wezuga onwe-ya: Ọ dighi onye ọjọ m'gāmara. Onye nēkpè madu-ibe-ya ikpè na nzuzo, onye ahu ka m'gēkpochapu: Onye nwere anya npako na obi di nganga, onye ahu ka m'nāpughi inagide. Anyam abua di n'aru ndi kwesiri ntukwasi-obi n'ala, ka mu na ha we biri: Onye nēje ije n'uzọ zuru okè, onye ahu gējerem ozi. Onye nālu ọlu aghughọ agaghi-ebi n'etiti ulom: Onye nēkwu okwu-ugha agaghi-eguzosi ike n'iru anyam. Kwa-ututu ka m'gēkpochapu ndi nile nēmebi iwu n'ala; Isi n'obodo Jehova kpochapu ndi nile nālu ajọ ihe.

