ABÙ ỌMA 100:1-5
ABÙ ỌMA 100:1-5 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Tikusienụ ONYENWE ANYị mkpu ọṅụ ike, ụwa niile. Jiri obi ụtọ fee ONYENWE ANYị ofufe; jirinụ ịbụ abụ ọṅụ bịa nʼihu ya Matanụ na ONYENWE ANYị bụ Chineke. Ọ bụ ya onwe ya kere anyị, ọ bụkwa ya nwe anyị, anyị bụ ndị ya, igwe atụrụ nke ọ na-azụ. Jirinụ ekele banye nʼọnụ ụzọ ama ya jiri otuto baa nʼogige ya; keleenụ ya, tookwa aha ya. Nʼihi na ONYENWE ANYị dị mma, ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Ruo ọgbọ niile ka ikwesi ntụkwasị obi ya na-adịgidekwa.
ABÙ ỌMA 100:1-5 Bible Nso (IGBOB)
Tikusienu Johova nkpu ọṅù ike, uwa nile. Werenu ọṅù fè Jehova òfùfè: Werenu iti-nkpu ọṅù bia n'iru Ya. Maranu na Jehova, Ya onwe-ya bu Chineke: Ya onwe-ya emewo ayi, ọ bu kwa Ya nwe ayi; Ayi bu ndi-Ya, na ìgwè aturu nke ọzùzù-anu-Ya. Werenu ekele ba n'ọnu-uzọ-ama-Ya nile, Werenu otuto ba n'ogige-Ya nile: Kelenu Ya, gọzi-kwa-nu aha-Ya. N'ihi na Jehova di nma; rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di; Rue ọb͕ọ nile ka ikwesi-ntukwasi-obi-Ya di kwa.