Tikusienụ ONYENWE ANYị mkpu ọṅụ ike, ụwa niile. Jiri obi ụtọ fee ONYENWE ANYị ofufe; jirinụ ịbụ abụ ọṅụ bịa nʼihu ya Matanụ na ONYENWE ANYị bụ Chineke. Ọ bụ ya onwe ya kere anyị, ọ bụkwa ya nwe anyị, anyị bụ ndị ya, igwe atụrụ nke ọ na-azụ. Jirinụ ekele banye nʼọnụ ụzọ ama ya jiri otuto baa nʼogige ya; keleenụ ya, tookwa aha ya. Nʼihi na ONYENWE ANYị dị mma, ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Ruo ọgbọ niile ka ikwesi ntụkwasị obi ya na-adịgidekwa.
Gụọ Abụ Ọma 100
Geere nke a ntị Abụ Ọma 100
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Abụ Ọma 100:1-5
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị