ILU 9:13-18
ILU 9:13-18 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nwanyị dị nzuzu na-eme mkpọtụ, o nweghị uche; ihere adịghịkwa eme ya. Ọ na-anọ ọdụ nʼọnụ ụzọ ụlọ ya, nʼelu oche nʼebe dịkarịsịrị elu nʼobodo, na-akpọ ndị na-aga nʼụzọ oku, bụ ndị na-aga mkpa ha, “Ka ndị niile amamihe kọrọ bịa nʼụlọ m.” Ọ na-asịkwa ndị na-enweghị uche, “Mmiri e zutere nʼohi na-atọ ụtọ, nri e riri na nzuzo na-atọkarịkwa nʼụtọ.” Ma ha adịghị aghọta na ndị nʼadịghị ndụ nọ nʼebe ahụ, na ndị ọ kpọrọ oku nri aghọọlarị ndị nọ nʼala mmụọ.
ILU 9:13-18 Bible Nso (IGBOB)
Nwanyi nzuzu nēme nkpọtu; Onye nēnweghi uche ka ọ bu, ọ maghi kwa ihe ọ bula. Ọ nānọdu kwa n'ọnu-uzọ ulo-ya, N'elu oche n'ebe nile di elu nke obodo, Ikpọ ndi nāgabiga n'uzọ òkù, Bú ndi nāgazi agazi n'okporo-uzọ-ha, Onye ọ bula nēnweghi uche, ya wezuga onwe-ya bata n'ebe a: Ọzọ, onye obi amam-ihe kọrọ, nwanyi ahu asiwo ya, Miri ezutara ezuta nātọ utọ, Nri eriri na nzuzo di utọ. Ma nwoke ahu amaghi na ndi nādighi ndu nọ n'ebe ahu; Na ọ bu n'ebe nile miri emi nke ala-mọ ka ndi ọ kpọrọ nọ.