ILU 9:1-12
ILU 9:1-12 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Amamihe ewuola ụlọ ukwu ya nʼelu ogidi asaa. O doziela oriri ya nʼusoro, o gbuola anụ ya, gwaakwa mmanya. O zipụkwala ndị ozi ya ka ha gaa kpọọ mmadụ niile, site nʼebe dị elu nke obodo ka ha nọ na-akpọ oku na-asị, “Bịanụ nʼụlọ m, unu ndị niile na-enweghị uche” Ma nye ndị amamihe kọrọ, ọ na-asị, “Bịanụ, rie nri m, ṅụọkwa mmanya m gwakọtara. Hapụnụ ụzọ enweghị uche unu, ka unu were dị ndụ; gbasokwanụ ụzọ mmụọ ịghọta ihe.” Onye ọbụla na-adọ onye na-akwa emo aka na ntị na-ewetara onwe ya nlelị; onye na-abara mmadụ ọjọọ mba na-enweta nkọcha. Abarala ndị na-akwa emo mba, ma ọ bụghị ya, ha ga-akpọ gị asị; baara ndị maara ihe mba, ha ga-ahụ gị nʼanya. Kuziere onye maara ihe ihe o kwesiri ịmụta, ọ ga-ama ihe karịa, kuziere onye ziri ezi ihe ọ ga-atụkwasị ihe ọ mụtara nʼamamihe ya. Nʼihi na ịtụ egwu ONYENWE ANYị bụ mmalite amamihe, inwe ihe ọmụma banyere onye Nsọ ahụ bụkwa nghọta. Nʼihi na ọ bụ site na amamihe, ka ụbọchị gị ga-adị ogologo. A ga-etinyekwara gị ọtụtụ afọ na ndụ gị. Ị bụrụ onye nwere amamihe, amamihe gị ga-abara gị uru, ma ị bụrụ onye na-akwa emo, naanị gị ga-ata ahụhụ ya.
ILU 9:1-12 Bible Nso (IGBOB)
Amam-ihe ewuwo ulo-ya, Ọ waputawo ogidi asa ya: O b͕uwo anu-ob͕ub͕u-ya; ọ gwawo manya-vine-ya agwa; O dowo kwa table-ya n'usoro. O zipuwo umu-ab͕ọghọ-ya, ọ nākpọ òkù N'elu ebe nile di elu nke obodo, si, Onye ọ bula nēnweghi uche, ya wezuga onwe-ya bata n'ebe a: Onye obi amam-ihe kọrọ, amam-ihe asiwo ya, Bianu, rienu nrim ufọdu, Ṅu-kwa-nu manya-vine ufọdu nke m'gwaworo agwa. Rapunu amaghi-ihe, unu ndi nēnweghi uche, we di ndu; Ga-kwa-nu n'iru n'uzọ nghọta. Onye nādọ onye nākwa emò aka na nti nēwetara onwe-ya nlelì: Ọzọ, onye nābara onye nēmebi iwu nba nēwetara onwe-ya ọlu-ya. Abarala onye nākwa emò nba, ka o we ghara ikpọ gi asì: Bara onye mara ihe nba, ọ gāhu kwa gi n'anya. Nye onye mara ihe nmuta, ọ gāmara kwa ihe kari: Me ka onye ezi omume mara ihe, ọ gātukwasi ihe-nmuta n'amam-ihe-ya. Nmalite amam-ihe ka egwu Jehova bu: Ihe-ọmuma nke Onye Nsọ bu kwa nghọta. N'ihi na site na mu ka ubọchi-gi gāba uba, Agātukwasi-kwa-ra gi arọ ndu. Ọ buru na i mara ihe, i maworo onwe-gi ihe: Ọ buru kwa na i kwa emò, nání gi gēbu ya.