ILU 8:22-31
ILU 8:22-31 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“ONYENWE ANYị kpụrụ m dịka mmalite ụzọ ya, tupu o bido ike ihe ọbụla ọzọ. Site nʼebighị ebi gara aga ka m dị; adịkwa m adị tupu e kee ụwa. Anọ m na-adị tupu e kee ogbu mmiri, tupu isi iyi ọbụla agbapụta mmiri nʼelu ụwa, tupu e kee ugwu ukwu na ugwu nta. E, amụọla m rịị tupu Chineke ekee ụwa na osisi niile, na aja niile dị nʼime ya. Anọ m ya mgbe o doziri mbara eluigwe nʼọnọdụ ya, mgbe ọ tụsara ha nʼelu ogbu mmiri niile; mgbe o hiwere mbara eluigwe, mgbe o mere ka isi iyi niile nke ogbu mmiri dị ike, mgbe ọ kpara oke nye osimiri ebe ọ ga-akwụsị, ka mmiri ya ghara ịgafe iwu ya, mgbe ọ kara akara ebe a tọrọ ntọala nke ụwa. Oge ahụ niile ka m na-anọ nʼakụkụ ya dịka onye ǹka. Ihe banyere m na-atọkwa ya ụtọ; ana m egwuri egwu nʼihu ya. Ihe niile o kere tọkwara m ụtọ, ụwa niile na ụmụ mmadụ!
ILU 8:22-31 Bible Nso (IGBOB)
Jehova nwerem na nmalite uzọ-Ya, Tutu ọlu-Ya nile site na mb͕e ahu. Site na mb͕e ebighi-ebi ka emerem ka m'guzosie ike, site n'isi-mbu, Tutu uwa adi. Mb͕e ọ dighi ob͕u-miri ọ bula di, amuputaram; Mb͕e ọ dighi isi-iyi ọ bula di nke juputara na miri. Tutu eme ka ntọ-ala ugwu nile bamie n'ala, Tutu ugwu ntà nile adi ka amuputaram: Mb͕e Ọ kēmeghi uwa, ma-ọbu azu obodo, Ma-ọbu nmalite ájá nke elu-uwa dum madu bi. Mb͕e O doziri elu-igwe, n'ebe ahu ka m'nọ: Mb͕e O nyere ukpuru, si, Ka ihe b͕ara buruburu dikwasi n'iru ob͕u-miri: Mb͕e Ọ mere ka mbara-ígwé sie ike n'elu: Mb͕e emere ka isi-iyi nile nke ob͕u-miri di ike: Mb͕e O ji kpara oké osimiri ókè-ya, Ka miri we ghara igabiga okwu-ọnu-Ya: Mb͕e O ji turu ntọ-ala uwa ukpuru: Anọkwam n'akuku Ya, dika onye-ọ̀kà: M'we buru ihe nātọ Ya utọ kwa-ubọchi, Nēgwuri egwú n'iru Ya mb͕e nile; Nēgwuri egwú n'elu-uwa dum madu bi n'uwa-Ya; Ihe nātọm utọ di kwa n'ebe umu madu nọ.