ILU 8:1-11
ILU 8:1-11 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ọ bụ na amamihe adịghị eti mkpu? Ọ bụ na nghọta anaghị eme ka olu ya daa ụda? Ọ na-eguzo nʼelu ebe niile dị elu nʼokporoụzọ, nʼagbata ụzọ niile. Nʼọnụ ụzọ nke obodo niile na nʼọnụ ụzọ ụlọ niile ka ọ nọ na-eti mkpu, ọ na-asị, “Ụmụ mmadụ geenụ m ntị; ọ bụ unu ndị dị ndụ ka m na-agwa okwu. Unu ndị na-enweghị uche, nweenụ uche zuruoke; unu ndị nzuzu, nweenụ nghọta. Geenụ m ntị, nʼihi na enwere m okwu dị mkpa m ga-agwa unu; Ihe ọbụla m kwuru bụ ihe ziri ezi, Ọnụ m na-ekwu eziokwu nʼihi na akpọrọ m okwu ụgha asị. Ndụmọdụ m zuruoke, ọ dịkwa mma. Ihe ọjọọ ọbụla adịghị nʼime ya. Nʼebe onye nwetara nghọta nọ, okwu m doro anya; nʼebe ndị chọtara ihe ọmụma nọ, okwu m ziri ezi. Họrọ ịdọ aka na ntị m karịa ọlaọcha họrọkwa ihe ọmụma karịa ọlaedo dị ezi mma.” Amamihe dị mkpa karịa nkume rubi dị oke ọnụahịa. Ọ dịkwaghị ihe a ga-eji tụnyere ya.
ILU 8:1-11 Bible Nso (IGBOB)
Amam-ihe, ọ̀ dighi-akpọ òkù? Nghọta kwa, ọ̀ dighi-eme ka olu-ya da udà? N'elu ebe nile di elu n'akuku uzọ, N'ab͕ata uzọ nile, ka O guzoworo onwe-ya; N'akuku ọnu-uzọ-ama nile, n'ọnu amá obodo, Na nbata ọnu-uzọ nile, ka ọ nētisi nkpu ike, si, Ọ bu unu, madu, ka m'nākpọku; Olum nādaku kwa umu madu. Unu ndi nēnweghi uche, ghọtanu ezi uche; Unu ndi-nzuzu kwa, menu ka obi-unu ghọta ihe. Nurunu, n'ihi na isi ihe di iche iche ka m'nēkwu; Nsaghe eb͕ub͕ere-ọnum gābu kwa ihe di iche iche ziri ezi. N'ihi na ezi-okwu ka okpo-ọnum nēkwu dika onye nātughari uche; Ọzọ, ihe-árú nke eb͕ub͕ere-ọnum ka nmebi-iwu bu. N'ezi omume ka okwu nile nke ọnum di; Ọ dighi ihe nēzighi ezi ma-ọbu ihe b͕agọrọ ab͕agọ di nime ha. Ha nile putara ìhè n'ebe onye-nghọta nọ, Ha zi-kwa-ra ezi n'ebe ndi nāchọta ihe-ọmuma nọ. Nara idọ-aka-na-ntim, anara-kwa-la ọla-ọcha; Nara kwa ihe-ọmuma kari ọla-edo ọma arọputara arọputa. N'ihi na amam-ihe di nma kari ruby; Ihe nile kwa nke nātọ madu utọ, ha agaghi-ara ka ya.