ILU 5:15-20
ILU 5:15-20 Bible Nso (IGBOB)
Ṅua miri sitere n'olùlù nke aka gi, Na miri nērù erù site n'ime olùlù-miri nke aka gi. Isi-iyi-gi, hà gāwasasi n'èzí? Ọ̀ bu n'amá ka iyi miri gāwasasi? Ka ha diri nání gi onwe-gi, Ma ka ndi nābughi ndi nke gi ghara isoro gi nwe ha. Ka isi-iyi-gi buru ihe agọziri agọzi; Ṅuri kwa ọṅu na nwunye i luru n'okorọbia. Dika nne-ele nke nāhu n'anya na nne-ewu-ọhia mara nma, Ka ara-ya abua nēju gi afọ na mb͕e nile; Nání n'ihu-n'anya-ya ka i ganāwaghari mb͕e nile. Ma n'ìhi gini ka i gēji nwayi nābughi nwunye-gi waghari, nwam? N'ìhi gini ka i gāb͕aku nwayi nābughi nwunye-gi obi?
ILU 5:15-20 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ṅụọ naanị mmiri nke si nʼite mmiri gị; mmiri dị mma nke si nʼolulu mmiri gị. Gịnị mere ị ga-eji kwe ka isi mmiri gị sọọ nʼokporoụzọ, ka mmiri nke aka gị sọọ nʼama? Kwee ka ha bụrụ nke naanị gị, nke onye ọbịa na-agaghị enwe oke nʼime ya. Kwere ka ịbụ nwoke gị bụrụ ngọzị nye gị; ṅụrịakwa ọṅụ nʼihi nwunye nke ị lụtara nʼokorobịa gị. Nne anụ nke na-ahụ nʼanya, dịka ele mara mma, ka ara dị ya nʼobi zuore gị, ka ịhụnanya ya na-enye gị obi ụtọ mgbe ọbụla. Gịnị ka ị na-achọ nʼahụ nwanyị na-akwa iko? Gịnị mere i ji na-amaku nwunye onye ọzọ obi?