Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ILU 5

5
1Nwam, ṅa nti n'amam-ihem;
Tọ nti-gi n'ala nye nghọtam:
2Ka i we debe ìzùzù di iche iche,
Ka eb͕ub͕ere-ọnu-gi we chebe kwa ihe-ọmuma.
3N'ihi na eb͕ub͕ere-ọnu nke nwayi nābughi nwunye-gi nābusi manu-aṅu,
Ihe kwọrọ murumuru kari manu ka okpo-ọnu-ya di kwa:
4Ma ikpe-azu-ya nēlu ilu dika wormwood,
Ọ di nkọ dika mma-agha iru abua.
5Ukwu-ya abua nārida n'ọnwu;
Ala-mọ ka nzọ-ukwu-ya nile nējidesi ike;
6Ka i we ghara ime ka okporo-uzọ ndu di lari:
Uzọ-ya nile emewo nkpatu, i gaghi-ama ha.
7Ma ub͕u a, umum, gēnum nti,
Unu esi-kwa-la n'okwu nile nke ọnum wezuga onwe-unu.
8Me ka uzọ-gi di anya n'ebe ọ nọ,
Abiaru-kwa-la ọnu-uzọ ulo-ya nso:
9Ka i we ghara inye ndi ọzọ ebube-gi,
Ka i we ghara kwa inye onye nēnweghi obi-ebere arọ-gi nile:
10Ka afọ we ghara iju ndi nābughi ndi nke gi n'ume-gi;
Ka ihe nile i dọb͕uru onwe-gi n'ọlu inweta we ghara kwa idi n'ulo onye nābughi nke gi;
11I we sua udè n'ikpe-azu-gi,
Mb͕e anu-aru-gi na aru-gi gāgwusi,
12I we si, Le ka m'siworo kpọ idọ-aka-na-nti asì nke-uku,
Ọ bu kwa iba-nba ka obim leliworo anya;
13Egeghkwam nti n'olu ndi-ozizim,
Ọ bughi kwa n'ebe ndi nēzím ihe nọ ka m'tọworo ntim n'ala!
14Ọ fọduru ihe ntà ka m'nọzue n'ihe ọjọ nile
N'etiti nkpọkọta na nzukọ ndi nkem.
15Ṅua miri sitere n'olùlù nke aka gi,
Na miri nērù erù site n'ime olùlù-miri nke aka gi.
16Isi-iyi-gi, hà gāwasasi n'èzí?
Ọ̀ bu n'amá ka iyi miri gāwasasi?
17Ka ha diri nání gi onwe-gi,
Ma ka ndi nābughi ndi nke gi ghara isoro gi nwe ha.
18Ka isi-iyi-gi buru ihe agọziri agọzi;
Ṅuri kwa ọṅu na nwunye i luru n'okorọbia.
19Dika nne-ele nke nāhu n'anya na nne-ewu-ọhia mara nma,
Ka ara-ya abua nēju gi afọ na mb͕e nile;
Nání n'ihu-n'anya-ya ka i ganāwaghari mb͕e nile.
20Ma n'ìhi gini ka i gēji nwayi nābughi nwunye-gi waghari, nwam?
N'ìhi gini ka i gāb͕aku nwayi nābughi nwunye-gi obi?
21N'ihi na n'iru anya Jehova ka uzọ nile nke madu di,
Okporo-uzọ-ya nile ka Ọ nēme ka ha di lari.
22Ajọ omume nile nke aka ya gānwude onye ahu nēmebi iwu,
Agēji kwa udọ̀ nile nke nmehie-ya jidesie ya ike.
23Onye ahu gānwu nānaraghi idọ-aka-na-nti;
Ọ bu kwa n'iba-uba nke uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ ka ọ nāwaghari.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ILU 5: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara