ILU 5:1-6
ILU 5:1-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nwa m, ṅaa ntị nʼokwu amamihe m, gee ntị nʼokwu nghọta m ndị a. Lezie anya, ka i debe izuzu dị iche iche, ka egbugbere ọnụ gị na-echebekwa ihe ọmụma. Nʼihi na egbugbere ọnụ nwanyị na-akwa iko na-atọ ka mmanụ aṅụ, okwu ọnụ ya na-akwọ mụrụmụrụ karịa mmanụ. Ma nʼikpeazụ, ọ na-elu ilu dịka oluilu dịkwa nkọ ka mma agha ihu abụọ. Ụkwụ ya abụọ na-arịdaru nʼọnwụ, nzọ ụkwụ ya abụọ na-eje nʼụzọ ọkụ ala mmụọ. Nʼihi na ọ dịghị agbaso ụzọ kwesiri ndụ; ụzọ ya gbagọrọ agbagọ, ma ọ maghị nke a.
ILU 5:1-6 Bible Nso (IGBOB)
Nwam, ṅa nti n'amam-ihem; Tọ nti-gi n'ala nye nghọtam: Ka i we debe ìzùzù di iche iche, Ka eb͕ub͕ere-ọnu-gi we chebe kwa ihe-ọmuma. N'ihi na eb͕ub͕ere-ọnu nke nwayi nābughi nwunye-gi nābusi manu-aṅu, Ihe kwọrọ murumuru kari manu ka okpo-ọnu-ya di kwa: Ma ikpe-azu-ya nēlu ilu dika wormwood, Ọ di nkọ dika mma-agha iru abua. Ukwu-ya abua nārida n'ọnwu; Ala-mọ ka nzọ-ukwu-ya nile nējidesi ike; Ka i we ghara ime ka okporo-uzọ ndu di lari: Uzọ-ya nile emewo nkpatu, i gaghi-ama ha.