Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ILU 5:1-19

ILU 5:1-19 Bible Nso (IGBOB)

Nwam, ṅa nti n'amam-ihem; Tọ nti-gi n'ala nye nghọtam: Ka i we debe ìzùzù di iche iche, Ka eb͕ub͕ere-ọnu-gi we chebe kwa ihe-ọmuma. N'ihi na eb͕ub͕ere-ọnu nke nwayi nābughi nwunye-gi nābusi manu-aṅu, Ihe kwọrọ murumuru kari manu ka okpo-ọnu-ya di kwa: Ma ikpe-azu-ya nēlu ilu dika wormwood, Ọ di nkọ dika mma-agha iru abua. Ukwu-ya abua nārida n'ọnwu; Ala-mọ ka nzọ-ukwu-ya nile nējidesi ike; Ka i we ghara ime ka okporo-uzọ ndu di lari: Uzọ-ya nile emewo nkpatu, i gaghi-ama ha. Ma ub͕u a, umum, gēnum nti, Unu esi-kwa-la n'okwu nile nke ọnum wezuga onwe-unu. Me ka uzọ-gi di anya n'ebe ọ nọ, Abiaru-kwa-la ọnu-uzọ ulo-ya nso: Ka i we ghara inye ndi ọzọ ebube-gi, Ka i we ghara kwa inye onye nēnweghi obi-ebere arọ-gi nile: Ka afọ we ghara iju ndi nābughi ndi nke gi n'ume-gi; Ka ihe nile i dọb͕uru onwe-gi n'ọlu inweta we ghara kwa idi n'ulo onye nābughi nke gi; I we sua udè n'ikpe-azu-gi, Mb͕e anu-aru-gi na aru-gi gāgwusi, I we si, Le ka m'siworo kpọ idọ-aka-na-nti asì nke-uku, Ọ bu kwa iba-nba ka obim leliworo anya; Egeghkwam nti n'olu ndi-ozizim, Ọ bughi kwa n'ebe ndi nēzím ihe nọ ka m'tọworo ntim n'ala! Ọ fọduru ihe ntà ka m'nọzue n'ihe ọjọ nile N'etiti nkpọkọta na nzukọ ndi nkem. Ṅua miri sitere n'olùlù nke aka gi, Na miri nērù erù site n'ime olùlù-miri nke aka gi. Isi-iyi-gi, hà gāwasasi n'èzí? Ọ̀ bu n'amá ka iyi miri gāwasasi? Ka ha diri nání gi onwe-gi, Ma ka ndi nābughi ndi nke gi ghara isoro gi nwe ha. Ka isi-iyi-gi buru ihe agọziri agọzi; Ṅuri kwa ọṅu na nwunye i luru n'okorọbia. Dika nne-ele nke nāhu n'anya na nne-ewu-ọhia mara nma, Ka ara-ya abua nēju gi afọ na mb͕e nile; Nání n'ihu-n'anya-ya ka i ganāwaghari mb͕e nile.

ILU 5:1-19 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Nwa m, ṅaa ntị nʼokwu amamihe m, gee ntị nʼokwu nghọta m ndị a. Lezie anya, ka i debe izuzu dị iche iche, ka egbugbere ọnụ gị na-echebekwa ihe ọmụma. Nʼihi na egbugbere ọnụ nwanyị na-akwa iko na-atọ ka mmanụ aṅụ, okwu ọnụ ya na-akwọ mụrụmụrụ karịa mmanụ. Ma nʼikpeazụ, ọ na-elu ilu dịka oluilu dịkwa nkọ ka mma agha ihu abụọ. Ụkwụ ya abụọ na-arịdaru nʼọnwụ, nzọ ụkwụ ya abụọ na-eje nʼụzọ ọkụ ala mmụọ. Nʼihi na ọ dịghị agbaso ụzọ kwesiri ndụ; ụzọ ya gbagọrọ agbagọ, ma ọ maghị nke a. Ugbu a ụmụ m, geenụ m ntị, unu esikwala nʼokwu niile nke ọnụ m wezuga onwe unu. Gbaara nwanyị dị otu a ọsọ! Ejekwala ọnụ ụzọ ụlọ ya nso, ka ị ghara ire ugwu gị nʼebe ndị ọzọ nọ, maọbụ were ndụ gị tinye nʼaka ndị na-enweghị obi ebere. Ka ndị ọbịa ghara inwe oke oriri nʼelu akụ gị, ka ihe niile ị dọgburu onwe gị nʼọrụ ịkpata gharakwa imejupụta ụlọ onye ọzọ. Ka ị gharakwa ịsụ ude nʼikpeazụ mgbe ọrịa ga-eripịa ọkpụkpụ gị na anụ ahụ gị. Mgbe ị ga-asị, Lee ka m si kpọọ ịdọ aka na ntị asị! “Leekwa ka obi m si lelịa iba mba anya! Egeghị m ntị nʼozizi nke ndị nkuzi m maọbụ nabata ndụmọdụ nke ndị ndụmọdụ m. Nʼihi na ugbu a, abịaruola m na mbibi nʼihu ọha mmadụ niile.” Ṅụọ naanị mmiri nke si nʼite mmiri gị; mmiri dị mma nke si nʼolulu mmiri gị. Gịnị mere ị ga-eji kwe ka isi mmiri gị sọọ nʼokporoụzọ, ka mmiri nke aka gị sọọ nʼama? Kwee ka ha bụrụ nke naanị gị, nke onye ọbịa na-agaghị enwe oke nʼime ya. Kwere ka ịbụ nwoke gị bụrụ ngọzị nye gị; ṅụrịakwa ọṅụ nʼihi nwunye nke ị lụtara nʼokorobịa gị. Nne anụ nke na-ahụ nʼanya, dịka ele mara mma, ka ara dị ya nʼobi zuore gị, ka ịhụnanya ya na-enye gị obi ụtọ mgbe ọbụla.