ILU 31:27-31
ILU 31:27-31 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ọ na-etinye uche nʼihe niile banyere ezinaụlọ ya, ọ naghị arụ ọrụ umengwụ. Ụmụ ya na-ebili gọzie ya; otu a kwa di ya ga-eto ya ezi otuto. Ọ ga-asị; “E nwere ọtụtụ ndị inyom ndị bụ ezi nwunye nye di ha, ma gị onwe gị kachasị ha niile mma.” Ịma mma nke elu ahụ adịghị egosi ihe mmadụ bụ, nʼihi na ịma mma adịghị adịgide ogologo oge. Ma nwanyị ọbụla nke na-atụ egwu ONYENWE ANYị bụ onye e kwesiri ito. E kwesiri ito ya nʼihi ọrụ ọma niile nke aka ya rụpụtara. Ka ọrụ ya niile wetara ya otuto nʼọnụ ụzọ ama nke obodo.
ILU 31:27-31 Bible Nso (IGBOB)
Ọ nēche ojije nile nke èzí-na-ulo-ya nche nke-ọma, Ọ bughi kwa nri ume-ngwu ka o nēri. Umu-ya ebiliwo, kpọ ya nwayi ihe nāgara nke-ọma; Di-ya kwa, o nēto kwa ya, si: Ọtutu umu-ndinyom emewo omume kwesiri ndinyom nējide onwe-ha nke-ọma, Ma gi onwe-gi kachasi ha nile. Amara bu ugha, ima-nma bu kwa ihe-efu: Ma nwayi nke nātu egwu Jehova, nwayi ahu gēnwe otuto Nyenu ya ihe sitere na nke aka-ya abua lutara; Ka ọlu-ya nile to kwa ya n'ọnu-uzọ-ama nile.