Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ILU 31

31
1Okwu Lemuel, bú eze; ibu eboro ya nke nne-ya ji dọ ya aka na nti.
2Gini, nwam? gini kwa, nwa nke afọm?
Gini kwa, nwa nke nkwa nile m'kwere?
3Enyela ndinyom ike-gi,
Enye-kwa-la ihe nēbibi ndi-eze uzọ-gi nile.
4Ka ndi-eze ghara iṅu manya-vine, Lemuel, ka ndi-eze ghara iṅu manya-vine;
Ka ndi-isi ghara kwa isi, Òle ebe ka ihe-ọṅuṅu nke nābà n'anya di?
5Ka ha we ghara iṅu, we chezọ ukpuru atọrọ,
We b͕anwe ikpé nke ndi nile ewedara n'ala.
6Nyenu onye nāla n'iyì ihe-ọṅuṅu nābà n'anya,
Nye-kwa-nu ndi nkpuru-obi-ha di ilu manya-vine:
7Ya ṅua, we chezọ ob͕eye ọ bu,
Ghara kwa icheta ọnọdu ọjọ ya ọzọ.
8Saghere onye-ob͕i ọnu-gi,
N'okwu-ikpe nke ndi nile nāla n'iyì.
9Saghe ọnu-gi, kpe ikpe n'ezi omume,
Kpeputa kwa onye ewedara n'ala na ob͕eye.
10Nwayi nke nējide onwe-ya nke-ọma, ònye gāchọputa ya?
N'ihi na ọnu-ahia-ya kariri ruby nke-uku.
11Obi di-ya atukwasiwo ya obi,
Ọ dighi kwa ihe-nkwata nākọ nwoke ahu.
12Nwayi ahu emesowo ya ezi ihe, ọ bughi kwa ihe ọjọ,
Ubọchi nile nke ndu-ya.
13Ọ chọwo aji-anu na flax,
We nālu ọlu nātọ aka-ya abua utọ.
14Ọ di ka ub͕ọ onye-ahia;
Site n'ebe di anya ka ọ nēweta nri-ya.
15O nēbili kwa mb͕e abali nādi kwa,
We nye ulo-ya nri,
Nye kwa umu-ab͕ọghọ-ya òkè-ha.
16O zuwo izùzù ọhia, we nweta ya:
Site n'ihe aka-ya abua lutara ka ọ kuworo ubi-vine.
17O kewo ike n'úkwù-ya dika ihe-ọkiké,
Me kwa ka ogwe-aka-ya abua nwe ume.
18Ọ matawo na ihe-ahia-ya di nma:
Oriọna-ya adighi-anyu n'abali.
19Aka-ya abua ka o setiworo n'osisi ikuku ogho,
Ọbu-aka-ya abua ejidesiwo kwa ozele ike.
20Ọbu-aka-ya ka ọ b͕asapuworo nye onye ewedara n'ala;
E, aka-ya abua ka o setiworo rue ob͕eye aru.
21Ọ dighi-atu egwu snow, na ọ gēme ulo-ya ihe;
N'ihi na ulo-ya nile nēyi uwe uhie.
22Ákwà-nb͕abá mara nma ka ọ kpaworo onwe-ya;
Ezi ákwà ọcha na ákwà ododo ka uwe-ya bu.
23Onye amara n'ọnu-uzọ-ama ka di-ya bu,
Mb͕e ọ nānọdu n'etiti ndi-okenye ala.
24Uwe ákwà ọcha ka nwayi ahu kpaworo, we re ya;
Ihe-ọkiké ka ọ nyeworo onye-ahia.
25Ike na ima-nma bu uwe-oyiyi-ya;
Ọ nāchì kwa ubọchi di n'iru ọchì.
26Ọnu-ya ka ọ sagheworo n'amam-ihe;
Iwu nke ebere dikwasi kwa n'ire-ya.
27Ọ nēche ojije nile nke èzí-na-ulo-ya nche nke-ọma,
Ọ bughi kwa nri ume-ngwu ka o nēri.
28Umu-ya ebiliwo, kpọ ya nwayi ihe nāgara nke-ọma;
Di-ya kwa, o nēto kwa ya, si:
29Ọtutu umu-ndinyom emewo omume kwesiri ndinyom nējide onwe-ha nke-ọma,
Ma gi onwe-gi kachasi ha nile.
30Amara bu ugha, ima-nma bu kwa ihe-efu:
Ma nwayi nke nātu egwu Jehova, nwayi ahu gēnwe otuto
31Nyenu ya ihe sitere na nke aka-ya abua lutara;
Ka ọlu-ya nile to kwa ya n'ọnu-uzọ-ama nile.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ILU 31: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara