ILU 3:5-8
ILU 3:5-8 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Tụkwasị ONYENWE ANYị obi gị niile, adaberekwala na nghọta gị. Nʼihe ọbụla ị na-eme, ka Chineke bute ụzọ, ọ ga-eduzi gị, meekwa ka okporoụzọ gị niile gazie. A bụla onye maara ihe nʼanya nke onwe gị. Tụọ ONYENWE ANYị egwu, kpọọkwa ihe ọjọọ asị. Nke a ga-eme ka i nwee ahụ ike gbaakwa ọkpụkpụ gị ume.
Kesaa
Gụọ ILU 3ILU 3:5-8 Bible Nso (IGBOB)
Tukwasi Jehova obi-gi nile, Adabere-kwa-la nghọta-gi: N'uzọ-gi nile mara Ya, Ya onwe-ya gēme kwa ka okporo-uzọ-gi nile zie ezi. Abula onye mara ihe n'anya gi onwe-gi; Tua egwu Jehova, we si n'ihe ọjọ wezuga onwe-gi: Ya buru ihe nāgwọ otubo-gi, Ya buru kwa umi diri ọkpukpu-gi nile.
Kesaa
Gụọ ILU 3