ILU 3:27-32
ILU 3:27-32 Bible Nso (IGBOB)
Eb͕ochila ezi ihe na ndi ọ diri, Mb͕e ọ diri ike aka-gi ime ya. Asila madu-ibe-gi, Je, lata, Echi ka m'gēnye gi; Mb͕e ọ di n'aka-gi. Echèputala ihe ọjọ megide madu-ibe-gi, Ebe onye ahu nēbi gi nso na ntukwasi-obi. Gi na madu esela okwu n'efu, Ma ọ buru na o mesoghi gi ihe ọjọ. Ekwosola onye neme ihe-ike ekworo, Arọputa-kwa-la otù efu n'uzọ-ya nile. N'ihi na ihe-árú n'anya Jehova ka onye sihiere esihie bu: Ma n'aka ndi ziri ezi ka ìzù nzuzo Ya di.
ILU 3:27-32 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ejigidele ihe ọma ị pụrụ imere onye ọzọ mgbe ọ dị gị nʼaka ime ya. A sịkwala onye agbataobi gị laa, bịaghachi azụ echi mgbe i nwere ike ime ya taa. Agbala izu ọjọọ megide onye agbataobi gị, nʼihi na o nwere ntụkwasị obi nʼebe ị nọ. Ebola mmadụ ebubo na-enweghị isi, mgbe onye ahụ na-emeghị gị ihe ọjọọ ọbụla. Ekwosola onye na-eme ihe ike ekworo maọbụ họrọ ụzọ ya ọbụla. Nʼihi na ndị dị otu a bụ ihe arụ nʼanya ONYENWE ANYị, ma ọ na-emeso ndị na-eme ihe ziri ezi mmeso ọma.