ILU 3:13-18
ILU 3:13-18 Bible Nso (IGBOB)
Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu nke chọtaworo amam-ihe bu, Ya na madu nke nēnweputa nghọta. N'ihi na ọzuzú-ahia-ya di nma kari ọzuzú-ahia ọla-ọcha, Urù-ya di nma kari ọla-edo ọma. Ihe di oké ọnu-ahia ka ọ bu kari ruby: Ihe nile kwa nke nātọ gi utọ, ha agaghi-ara ka ya. Ubọchi ndu di ogologo di n'aka-nri-ya; N'aka-ekpe-ya ka àkù na nsọpuru di. Uzọ-ya nile bu uzọ nke idi-utọ, Okporo-uzọ-ya nile bu kwa udo. Osisi nēnye ndu ka ọ buru ndi nējide ya aka: E, onye ọ bula nke nējisi ya aka ike bu onye ihe nāgara nke-ọma.
ILU 3:13-18 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ onye chọtara amamihe, onye nwetara nghọta. Nʼihi na amamihe dị mma karịa ọlaọcha, ọ bakwara uru karịa ọlaedo. Ọ dị oke ọnụahịa karịa ọla rubi, ọ dịghị ihe na-amasị gị e ji atụnyere ya. Ndụ ogologo dị nʼaka nri ya; nʼaka ekpe ya ka akụnụba na nsọpụrụ dịkwa. Ụzọ ya bụ ụzọ dị mma bụrụkwa ụzọ udo. Amamihe bụ osisi nke ndụ nye ndị na-ejide ya aka, e, onye ahụ nke na-ejidesi ya aka ike ka ihe na-agara nke ọma.