ILU 3:1-8
ILU 3:1-8 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nwa m echezọla ihe niile m ziri gị. Ma debe iwu m nʼobi gị. Nʼihi na ha ga-eme ka ndụ gị dị ogologo ruo ọtụtụ afọ, wetakwara gị udo na ọganihu. Ekwela ka ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi hapụ gị, kekwasị ha nʼolu gị, deekwa ha nʼelu mbadamba nkume, bụ obi gị. Mgbe ahụ, ị ga-enwe ihuọma na ezi aha nʼanya Chineke na nʼihu mmadụ. Tụkwasị ONYENWE ANYị obi gị niile, adaberekwala na nghọta gị. Nʼihe ọbụla ị na-eme, ka Chineke bute ụzọ, ọ ga-eduzi gị, meekwa ka okporoụzọ gị niile gazie. A bụla onye maara ihe nʼanya nke onwe gị. Tụọ ONYENWE ANYị egwu, kpọọkwa ihe ọjọọ asị. Nke a ga-eme ka i nwee ahụ ike gbaakwa ọkpụkpụ gị ume.
ILU 3:1-8 Bible Nso (IGBOB)
Nwam, echezọla iwum; Ma ka obi-gi chebe ihe nile m'nyere n'iwu: N'ihi na ubọchi ndu nke di ogologo, na ọtutu arọ nke ndu, Na udo, ka ha gātukwasiri gi. Ekwela ka ebere na ezi-okwu rapu gi: Ke ha n'olu-gi; De ha n'elu mbadamba nkume, bú obi-gi: Chọta kwa amara na ezi uche N'anya Chineke na madu. Tukwasi Jehova obi-gi nile, Adabere-kwa-la nghọta-gi: N'uzọ-gi nile mara Ya, Ya onwe-ya gēme kwa ka okporo-uzọ-gi nile zie ezi. Abula onye mara ihe n'anya gi onwe-gi; Tua egwu Jehova, we si n'ihe ọjọ wezuga onwe-gi: Ya buru ihe nāgwọ otubo-gi, Ya buru kwa umi diri ọkpukpu-gi nile.