Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ILU 3:1-35

ILU 3:1-35 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Nwa m echezọla ihe niile m ziri gị. Ma debe iwu m nʼobi gị. Nʼihi na ha ga-eme ka ndụ gị dị ogologo ruo ọtụtụ afọ, wetakwara gị udo na ọganihu. Ekwela ka ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi hapụ gị, kekwasị ha nʼolu gị, deekwa ha nʼelu mbadamba nkume, bụ obi gị. Mgbe ahụ, ị ga-enwe ihuọma na ezi aha nʼanya Chineke na nʼihu mmadụ. Tụkwasị ONYENWE ANYị obi gị niile, adaberekwala na nghọta gị. Nʼihe ọbụla ị na-eme, ka Chineke bute ụzọ, ọ ga-eduzi gị, meekwa ka okporoụzọ gị niile gazie. A bụla onye maara ihe nʼanya nke onwe gị. Tụọ ONYENWE ANYị egwu, kpọọkwa ihe ọjọọ asị. Nke a ga-eme ka i nwee ahụ ike gbaakwa ọkpụkpụ gị ume. Sọpụrụ ONYENWE ANYị site nʼinye ya mkpụrụ mbụ nke akụnụba gị, na mkpụrụ mbụ nke ihe ubi gị. Mgbe ahụ ka ọ ga-eme ka ọba gị niile jubigakwa oke, ebe ịnara mmanya gị ga-ejupụta na mmanya ọhụrụ. Nwa m nwoke ajụla ịdọ aka na ntị nke ONYENWE ANYị, ike agwụla gị ịnagide ịba mba ya. Nʼihi na ọ bụ ndị ONYENWE ANYị hụrụ nʼanya ka ọ na-abara mba, dịka nna si abara nwa ya nke ihe ya na-atọ ya ụtọ mba. Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ onye chọtara amamihe, onye nwetara nghọta. Nʼihi na amamihe dị mma karịa ọlaọcha, ọ bakwara uru karịa ọlaedo. Ọ dị oke ọnụahịa karịa ọla rubi, ọ dịghị ihe na-amasị gị e ji atụnyere ya. Ndụ ogologo dị nʼaka nri ya; nʼaka ekpe ya ka akụnụba na nsọpụrụ dịkwa. Ụzọ ya bụ ụzọ dị mma bụrụkwa ụzọ udo. Amamihe bụ osisi nke ndụ nye ndị na-ejide ya aka, e, onye ahụ nke na-ejidesi ya aka ike ka ihe na-agara nke ọma. Ọ bụ site nʼamamihe ka ONYENWE ANYị ji tọọ ntọala ụwa; ọ bụkwa nghọta ya mere ka eluigwe dịrị ebe ọ dị. Esitere nʼihe ọmụma ya kewaa ogbu mmiri niile, igwe ojii na-atụdakwa igirigi. Nwa m nwoke, ekwela ka ihe abụọ ndị a site nʼihu gị wezuga onwe ha: amamihe na nghọta nke ime ihe dị mma nʼizuzu zuruoke, nʼihi na ha na-enye gị ndụ ọhụrụ, ha bụkwaara gị ihe ịchọ mma amara nʼolu gị. Ha na-eme ka ị na-aga ije nʼụzọ gị na-enweghị ihe egwu maọbụ ihe mkpọbi ụkwụ. Mgbe ị ga-edina ala, ị gaghị atụ egwu, ị ga-edina ala ụra gị ga-adị ụtọ. Ị gaghị atụ egwu ihe mbibi mberede ọbụla maọbụ tụọ egwu ịla nʼiyi nke na-abịakwasị ndị ajọ omume. Nʼihi na ONYENWE ANYị bụ ebe ndabere gị, ọ ga-echebekwa gị. Ejigidele ihe ọma ị pụrụ imere onye ọzọ mgbe ọ dị gị nʼaka ime ya. A sịkwala onye agbataobi gị laa, bịaghachi azụ echi mgbe i nwere ike ime ya taa. Agbala izu ọjọọ megide onye agbataobi gị, nʼihi na o nwere ntụkwasị obi nʼebe ị nọ. Ebola mmadụ ebubo na-enweghị isi, mgbe onye ahụ na-emeghị gị ihe ọjọọ ọbụla. Ekwosola onye na-eme ihe ike ekworo maọbụ họrọ ụzọ ya ọbụla. Nʼihi na ndị dị otu a bụ ihe arụ nʼanya ONYENWE ANYị, ma ọ na-emeso ndị na-eme ihe ziri ezi mmeso ọma. Ọbụbụ ọnụ ONYENWE ANYị dị nʼụlọ ndị na-eme ajọ omume, ma ọ na-agọzi ụlọ ndị ezi omume. Ndị mpako na-akwa emo ka ya onwe ya na-akwakwa emo, ma ndị dị umeala nʼobi ka ọ na-enye amara. Ndị maara ihe na-enweta nsọpụrụ, ma ndị nzuzu na-enweta ihere.

ILU 3:1-35 Bible Nso (IGBOB)

Nwam, echezọla iwum; Ma ka obi-gi chebe ihe nile m'nyere n'iwu: N'ihi na ubọchi ndu nke di ogologo, na ọtutu arọ nke ndu, Na udo, ka ha gātukwasiri gi. Ekwela ka ebere na ezi-okwu rapu gi: Ke ha n'olu-gi; De ha n'elu mbadamba nkume, bú obi-gi: Chọta kwa amara na ezi uche N'anya Chineke na madu. Tukwasi Jehova obi-gi nile, Adabere-kwa-la nghọta-gi: N'uzọ-gi nile mara Ya, Ya onwe-ya gēme kwa ka okporo-uzọ-gi nile zie ezi. Abula onye mara ihe n'anya gi onwe-gi; Tua egwu Jehova, we si n'ihe ọjọ wezuga onwe-gi: Ya buru ihe nāgwọ otubo-gi, Ya buru kwa umi diri ọkpukpu-gi nile. Sọpuru Jehova site n'àkù-gi, Site kwa na nkpuru mbu nke ihe-ọmume-gi nile: Ọba-gi nile gējuputa kwa n'ihe-nriju-afọ, Ebe-nzọcha-nkpuru-vine-gi nile gētiwa kwa na manya-vine ọhu. Nwam, ajula idọ-aka-na-nti nke Jehova: Ike agwu-kwa-la gi n'iba-nba-Ya: N'ihi na onye Jehova nāhu n'anya ka Ọ nābara nba; Ọbuná dika nna si abara nwa-ya nke ihe-ya nātọ ya utọ nba. Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu nke chọtaworo amam-ihe bu, Ya na madu nke nēnweputa nghọta. N'ihi na ọzuzú-ahia-ya di nma kari ọzuzú-ahia ọla-ọcha, Urù-ya di nma kari ọla-edo ọma. Ihe di oké ọnu-ahia ka ọ bu kari ruby: Ihe nile kwa nke nātọ gi utọ, ha agaghi-ara ka ya. Ubọchi ndu di ogologo di n'aka-nri-ya; N'aka-ekpe-ya ka àkù na nsọpuru di. Uzọ-ya nile bu uzọ nke idi-utọ, Okporo-uzọ-ya nile bu kwa udo. Osisi nēnye ndu ka ọ buru ndi nējide ya aka: E, onye ọ bula nke nējisi ya aka ike bu onye ihe nāgara nke-ọma. Jehova jiri amam-ihe tọ ntọ-ala uwa; O doziri elu-igwe site na nghọta. Ejiri ihe-ọmuma-Ya kewa ob͕u-miri nile, Mbara-ígwé nile ji kwa ya atuda igirigi. Nwam, ekwela ka ha si n'anya-gi abua wezuga onwe-ha; Chebe nzube-ihe na ìzùzù; Ha gābu-kwa-ra nkpuru-obi-gi ndu, Bu-kwa-ra olu-gi amara. Mb͕e ahu ka i ganēje ije n'uzọ-gi na ntukwasi-obi, I gaghi-akpọbì kwa ukwu-gi, Ọ buru na i dina ala, i gaghi-atu oké egwu: E, i gēdina ala, ura-gi gātọ kwa utọ. Atula egwu site n'oké egwu mberede, Ma-ọbu site n'ikuku siri ike nke ndi nēmebi iwu, mb͕e ọ nābia: N'ihi na Jehova gābu ntukwasi-obi-gi, Ọ gēdebe kwa ukwu-gi ka aghara ijide ya. Eb͕ochila ezi ihe na ndi ọ diri, Mb͕e ọ diri ike aka-gi ime ya. Asila madu-ibe-gi, Je, lata, Echi ka m'gēnye gi; Mb͕e ọ di n'aka-gi. Echèputala ihe ọjọ megide madu-ibe-gi, Ebe onye ahu nēbi gi nso na ntukwasi-obi. Gi na madu esela okwu n'efu, Ma ọ buru na o mesoghi gi ihe ọjọ. Ekwosola onye neme ihe-ike ekworo, Arọputa-kwa-la otù efu n'uzọ-ya nile. N'ihi na ihe-árú n'anya Jehova ka onye sihiere esihie bu: Ma n'aka ndi ziri ezi ka ìzù nzuzo Ya di. Ọbubu-ọnu Jehova di n'ulo onye nēmebi iwu; Ma ebe-obibi ndi ezi omume ka Ọ nāgọzi. Ọ buru na ọ bu ndi nākwa emò ka Ya onwe-ya nākwa emò, Ma ọ bu ndi di ume-ala n'obi ka Ọ nēnye amara. Nsọpuru ka ndi mara ihe gēketa; Ma ndi-nzuzu nēbuli nlelì.