ILU 27:23-27
ILU 27:23-27 Bible Nso (IGBOB)
Mara iru igwè ewu na aturu-gi nke-ọma, Tukwasi obi-gi n'igwè anu-ulo-gi nile: N'ihi na ọ bughi rue mb͕e ebighi-ebi ka àkù di; Okpu-eze kwa, ọ̀ nādiru ọb͕ọ nile? Ekpopuwo ahihia, ewe hu ahihia ndu, Chikọta kwa ihe-ọkukú nile nke ugwu nile. Umu-aturu diri uwe-oyiyi-gi, Ọnu-ahia nke ọhia-gi ka ewu bu kwa: Ara ewu gēzu-kwa-ra nri-gi, zu-kwa-ra nri ulo-gi; Buru kwa ihe gēdebe umu-ab͕ọghọ-gi ndu.
ILU 27:23-27 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Lezie ọrụ gị anya nke ọma, marakwa ọnọdụ igwe ewu na atụrụ gị na anụ ụlọ ndị ọzọ, nʼihi na akụnụba adịghị adịgide. Ọ bụladị okpueze nke onye eze na-emesịa gabiga. Mgbe e gbupụchara ahịhịa ochie, nke ọhụrụ na-epupụta, mgbe ahụ ka a na-achịkọbata ahịhịa sị nʼugwu. Ụmụ atụrụ ga-enye gị uwe ị ga-eyi, ụmụ ewu ga-enyekwa gị ego ọnụahịa ala ubi gị. Ị ga-enwe mmiri ara ewu nke ga-ezuru gị na ndị ezinaụlọ gị nri, na nke ga-edozi ahụ ndị odibo nwanyị gị.