ILU 27:15-27
ILU 27:15-27 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mmiri na-ata nʼime ụlọ mgbe mmiri na-ezo na nwanyị na-eso okwu bụ otu. Onye nwere ike ịkwụsị ya nwere ike iji aka jide ifufe, maọbụ were aka jide mmanụ. Dịka e si eji igwe amụ igwe ọzọ ka ọ dị nkọ, otu a ka mmadụ si enyere ibe ya aka ịdị nkọ. Onye na-eche osisi fiig nche ga-eri mkpụrụ ya, onye na-echebekwa nna ya ukwu ka a ga-asọpụrụ. Dịka e si ahụ ihu mmadụ nʼime mmiri otu a ka obi mmadụ si egosi ihe onye ahụ bụ. Dịka afọ adịghị eju ọnwụ na mbibi, otu a ihe na-agụ anya mmadụ adịghị agwụ agwụ. Ite eji anụcha ihe dịrị ọlaọcha, oke ọkụ dịkwara ọlaedo ma a na-anwale ndị mmadụ site nʼotuto a na-enye ha. Nʼagbanyeghị na ị ga-egwepịa onye nzuzu nʼime ikwe, were aka odo gwee ha dịka mkpụrụ ọka, ị pụghị isite nʼahụ ha wepụ enweghị uche ha. Lezie ọrụ gị anya nke ọma, marakwa ọnọdụ igwe ewu na atụrụ gị na anụ ụlọ ndị ọzọ, nʼihi na akụnụba adịghị adịgide. Ọ bụladị okpueze nke onye eze na-emesịa gabiga. Mgbe e gbupụchara ahịhịa ochie, nke ọhụrụ na-epupụta, mgbe ahụ ka a na-achịkọbata ahịhịa sị nʼugwu. Ụmụ atụrụ ga-enye gị uwe ị ga-eyi, ụmụ ewu ga-enyekwa gị ego ọnụahịa ala ubi gị. Ị ga-enwe mmiri ara ewu nke ga-ezuru gị na ndị ezinaụlọ gị nri, na nke ga-edozi ahụ ndị odibo nwanyị gị.
ILU 27:15-27 Bible Nso (IGBOB)
Miri-ọtutu nke nātu mb͕e nile n'ubọchi oké miri-ozuzo, Ya na nwanyi nke nēse okwu yiri: Onye nēzobe ya ezobewo ifufe, Ọ bu kwa manu ka aka-nri-ya nēzute. Ígwè nāmucha ígwè; Otú a ka madu nāmucha iru eyì-ya. Onye nēche osisi fig gēri nkpuru-ya; Ọ bu kwa onye nāriba onye-nwe-ya ama ka agāsọpuru. Dika miri si eme ka iru hu iru, Otú a ka obi nēme ka madu hu madu. Afọ adighi-eju ala-mọ na ebe-ila-n'iyì; Otú a afọ adighi-eju anya abua nke madu. Ite eji anucha ihe diri ọla-ọcha, oké ọku di-kwa-ra ọla-edo, Anānwa kwa onye ọ bula site n'otuto-ya. Ọ buru na i ji aka-íkwè supia onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ n'íkwè n'etiti ọka asuru asu, Uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ agaghi-esi n'aru ya wezuga onwe-ya. Mara iru igwè ewu na aturu-gi nke-ọma, Tukwasi obi-gi n'igwè anu-ulo-gi nile: N'ihi na ọ bughi rue mb͕e ebighi-ebi ka àkù di; Okpu-eze kwa, ọ̀ nādiru ọb͕ọ nile? Ekpopuwo ahihia, ewe hu ahihia ndu, Chikọta kwa ihe-ọkukú nile nke ugwu nile. Umu-aturu diri uwe-oyiyi-gi, Ọnu-ahia nke ọhia-gi ka ewu bu kwa: Ara ewu gēzu-kwa-ra nri-gi, zu-kwa-ra nri ulo-gi; Buru kwa ihe gēdebe umu-ab͕ọghọ-gi ndu.