ILU 26:9-12
ILU 26:9-12 Bible Nso (IGBOB)
Dika ogwu nke dumiworo n'aka onye nāṅubiga manya ókè, Otú a ka ilu n'ọnu ndi-nzuzu di. Onye-ọ̀kà nākpu ihe nile, Ma onye nēgo onye-nzuzu ilu ọlu di ka onye nēgo ndi nāgabiga agabiga. Dika nkita nke chighariworo ọzọ n'ihe ọ b͕ọrọ, Otú a ka onye-nzuzu di nke nēme kwa ihe uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ ọzọ. Ì huwo onye ọ bula nke bu onye mara ihe n'anya-ya? Olile-anya diri onye-nzuzu kari onye ahu.
ILU 26:9-12 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Dịka ogwu manyere nʼaka onye na-aṅụbiga mmanya oke otu a ka ilu dị nʼọnụ onye nzuzu. Dịka ọgba ụta si agba ụta ya na-enweghị onye o bụ nʼobi, otu a ka ọ dị bụ onye na-enye onye nzuzu maọbụ onye o bụla na-agafe nʼụzọ ọrụ ka o rụọra ya. Dịka nkịta laghachiri ọzọ nʼihe ọ gbọrọ, otu a ka ndị nzuzu dị mgbe ha na-emekwa omume enweghị uche ha. Ị hụrụ onye mara ihe nʼanya nke onwe ya? Olileanya dị nye onye nzuzu karịa ndị dị otu a.