ILU 26:17-28
ILU 26:17-28 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Onye na-etinye onwe ya nʼesemokwu na-agbasaghị ya dị ka mmadụ na-apụ nʼokporoụzọ dọkpụrụ nkịta ọbụla ọ hụrụ na ntị. Dịka onye ara na-agba àkụ na-ere ọkụ nke na-eweta ọnwụ, ka nwoke ahụ bụ nke na-aghọgbu onye agbataobi ya ma sị, “ọ bụ naanị egwuregwu ka m na-egwu.” Ọkụ na-anyụ mgbe nkụ gwụrụ, otu a kwa esemokwu na-akwụsị mgbe a kwụsịrị ikwu ndị ọzọ okwu nʼazụ. Dịka icheku si eme ka nkụ nwuru ọkụ, otu a ka onye na-ese okwu si eme ka ọgụ nwuru ọkụ. Okwu niile nke onye na-agba asịrị na-ekwu dịka iberibe nri nʼatọ ezi ụtọ, ha na-agbadakwa nʼime ime ala afọ. Dịka ite aja ụrọ nke e ji ọlaọcha na-abaghị uru techie, ka egbugbere ọnụ dị nro nke obi jupụtara nʼihe ọjọọ bụ. Ndị iro na-eji egbugbere ọnụ ha gbanwee onwe ha, ma nʼime obi ha ọ bụ naanị aghụghọ dị ya. Okwu ọnụ ya nwere ike tọọ ụtọ na ntị ma ekwenyerela ha, nʼihi na ihe arụ asaa jupụtara nʼime obi ha. Ọ bụ ezie na ọ ga na-eme ka ọ hụrụ gị nʼanya, ma iro ya ga-apụta ihe, mmadụ niile ga-ahụkwa ya. Onye na-egwuru ibe ya olulu ga-adaba nʼime ya. Ọzọ, onye na-enuda nkume, ya ka nkume ahụ ga-adagbu. Onye ị kpọrọ asị bụ onye ị ga-achọ iwetara ihe mgbu site nʼịgha ụgha. Okwu ọma na-esighị nʼobi mmadụ pụta na-eweta ịla nʼiyi.
ILU 26:17-28 Bible Nso (IGBOB)
Onye nējide nkita na nti ka ọ bu, Bú onye nāgabiga, nēwebiga iwe ókè n'ihi ise-okwu nābughi nke ya. Dika onye-ará nke nātu àkú nēre ọku, Na àkú, na ọnwu; Otú a ka onye ahu di nke ghọb͕uworo madu-ibe-ya, We si, Ọ̀ bughi egwú ka m'nēgwu? Mb͕e nkú nādighi ọku gānyu: Otú a mb͕e ọ dighi onye nēkwu okwu-azu, ise-okwu gādaju. Dika icheku si di n'ebe icheku nēre ọku di, na dika nkú si di n'ebe ọku di; Otú a ka onye nēse okwu di ime ka ilu-ọ̀gù nwuru ọku. Okwu nile nke onye nēkwu okwu-azu di ka iberibe-nri di iche iche nātọ utọ nke-uku, Okwu ahu aridawo kwa n'ime-ime-ala afọ. Ejùjù nke amachitaworo n'afuru-uzu ọla-ọcha Ka eb͕ub͕ere-ọnu nke nēre ọku na obi ọjọ bu. Eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ka onye nke nākpọ asì nēji buru onye-iru-abua, Ma nime onwe-ya ka ọ nētiye aghughọ: Mb͕e olu-ya nēkwu amara, ekwela ya; N'ihi na ihe-árú asa di n'obi-ya. Ọ bu ezie na ikpọ-asi-ya ji nrafu ekpuchi onwe-ya, Ma agēkpughe ihe ọjọ ya nime nkpọkọta ndi-ya. Onye nēgwu olùlù, nime ya ka ọ gādabà: Ọzọ, onye nākpọre nkume, ya ka ọ gālaghachikuru. Ire okwu-ugha nākpọ ndi o gwepiaworo asì; Ọzọ, ọnu nke nēkwu ire-utọ nākpata nnuda.