ILU 24:23-34
ILU 24:23-34 Bible Nso (IGBOB)
Ndia bu kwa okwu nke ndi mara ihe. Imata iru madu n'ikpé adighi nma. Onye nāsi onye nēmebi iwu, Onye ezi omume ka i bu; Ndi nile di iche iche gākpọlu ya, mba nile gēwesa ya iwe: Ma ndi nābara ya nba ka ọ gādi utọ, Ọ bu kwa ndi ahu ka ezi ngọzi gābiakwasi. O ji eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua esutu ọnu, Bú onye nāza okwu ziri ezi. Dozie ije-ozi-gi n'èzí, Jikere-kwa-ra ya onwe-gi n'ọhia; Emesia wu kwa ulo-gi. Abula onye-àmà megide madu-ibe-gi n'efu; Ì gēji kwa eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua rafu? Asila, Dika o siri mem, otú a ka m'gēme ya; M'gēnyeghachi onye ahu dika ọlu-ya si di. N'akuku ubi onye-ume-ngwu ka m'gabigara, Na n'akuku ubi-vine nke madu obi amam-ihe kọrọ; Ma, le, o púchiri n'ogwu, Akuba kpuchiri iru-ya, Akwada-kwa-ra mb͕idi nkume ya. Mu onwem we hu, m'we tukwasi obim na ya: Ahurum ya, we nata idọ-aka-na-nti. Nwa ura ntà, nwa irù-ura ntà, Nwa ikpakọba-aka ntà idina ala: Ob͕eye-gi ewe bia dika onye nējeghari ipunara madu ihe; Ihe-ukọ-gi kwa, dika nwoke ji ọta.
ILU 24:23-34 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ndị a bụkwa okwu ọzọ ndị amamihe kwuru, iji gosi na ikpe ikpe na-akwụghị ọtọ adịghị mma. Onye ọbụla nke na-asị onye ikpe mara, “Onye ezi omume ka ị bụ,” ga-anata ọbụbụ ọnụ site nʼọnụ ọtụtụ mmadụ, mba niile ga-eweso ya iwe. Ma ọ ga-adịrị ndị ahụ na-abara onye ikpe mara mba na mma, ha ga-anatakwa ezi ngọzị. Ọsịsa ziri ezi bụ ihe na-egosi ikwesi ntụkwasị obi. Rụchaa ọrụ gị dị nʼezi. Dozie ala ubi gị. Emesịa wuoro onwe gị ụlọ. Agbala ama ụgha megide onye agbataobi gị nʼefu. Ọ bụ egbugbere ọnụ gị abụọ ka ị ga-eji ghọọ aghụghọ? Asịla, “Aga m emeso ha dịka ha siri meso m. Aga m akwụghachi ha ụgwọ ihe ha mere.” Esitere m nʼubi otu onye umengwụ gafee, bụ ubi vaịnị nke onye na-enweghị uche, hụ na ogwu etochiela ya, ahịhịa etochiekwala ya; mgbidi dị ya gburugburu adaakwala. Elegharịrị m ya anya site na ya mụta otu ihe a: Nwa ụra nta, nwa iru ụra nta, nwa ịchịkọba aka nta zuo ike ụbịam ga-abịakwasị gị dịka onye ohi, ụkọ abịakwasịkwa gị dịka onye na-apụnara mmadụ ihe.