Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ILU 24:17-34

ILU 24:17-34 Bible Nso (IGBOB)

Aṅurila mb͕e onye-iro-gi nāda, Ka obi-gi ghara kwa iteghari egwú ọṅù mb͕e ọ nāsu ngọngọ: Ka Jehova we ghara ihu ya, o we jọ njọ n'anya-Ya, O we me ka iwe-Ya si n'aru ya laghachi. Emela ka iwe-gi di ọku n'ihi ndi nēme ihe ọjọ; Ekwosola ndi nēmebi iwu ekworo. N'ihi na ọdi-n'iru agaghi-adiri onye ọjọ; Oriọna ndi nēmebi iwu gānyu. Nwam, tua egwu Jehova na eze: Agwakọtala onwe-gi na ndi nēnwo enwo: N'ihi na ọ bu na mberede ka nhuju-anya-ha gēbili; Ọdida nke ha abua kwa, ònye mara ya? Ndia bu kwa okwu nke ndi mara ihe. Imata iru madu n'ikpé adighi nma. Onye nāsi onye nēmebi iwu, Onye ezi omume ka i bu; Ndi nile di iche iche gākpọlu ya, mba nile gēwesa ya iwe: Ma ndi nābara ya nba ka ọ gādi utọ, Ọ bu kwa ndi ahu ka ezi ngọzi gābiakwasi. O ji eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua esutu ọnu, Bú onye nāza okwu ziri ezi. Dozie ije-ozi-gi n'èzí, Jikere-kwa-ra ya onwe-gi n'ọhia; Emesia wu kwa ulo-gi. Abula onye-àmà megide madu-ibe-gi n'efu; Ì gēji kwa eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua rafu? Asila, Dika o siri mem, otú a ka m'gēme ya; M'gēnyeghachi onye ahu dika ọlu-ya si di. N'akuku ubi onye-ume-ngwu ka m'gabigara, Na n'akuku ubi-vine nke madu obi amam-ihe kọrọ; Ma, le, o púchiri n'ogwu, Akuba kpuchiri iru-ya, Akwada-kwa-ra mb͕idi nkume ya. Mu onwem we hu, m'we tukwasi obim na ya: Ahurum ya, we nata idọ-aka-na-nti. Nwa ura ntà, nwa irù-ura ntà, Nwa ikpakọba-aka ntà idina ala: Ob͕eye-gi ewe bia dika onye nējeghari ipunara madu ihe; Ihe-ukọ-gi kwa, dika nwoke ji ọta.

ILU 24:17-34 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Aṅụrịla ọṅụ mgbe onye iro gị dabara na nsogbu. Ka obi gharakwa ịtọ gị ụtọ mgbe ọ dara. Nʼihi na ONYENWE ANYị pụrụ iwe iwe nʼihi ya megide gị ma kwụsị ịta ya ahụhụ. Ekwosola onye na-emebi iwu ekworo, maọbụ nwe anya ukwu nʼebe onye ajọ omume nọọ. Nʼihi na onye na-emebi iwu enweghị ọdịnihu; a ga-afụnyụkwa ọkụ onye ajọ omume. Nwa m, tụọ egwu ONYENWE ANYị na onye bụ eze, esonyerela ndị ozi na-enupu isi megide nna ha ukwu. Nʼihi na ọ bụ na mberede ka ị ga-eso ha daba na nhụju anya. Onye maara ihe ga-abụ ọgwụgwụ ya? Ndị a bụkwa okwu ọzọ ndị amamihe kwuru, iji gosi na ikpe ikpe na-akwụghị ọtọ adịghị mma. Onye ọbụla nke na-asị onye ikpe mara, “Onye ezi omume ka ị bụ,” ga-anata ọbụbụ ọnụ site nʼọnụ ọtụtụ mmadụ, mba niile ga-eweso ya iwe. Ma ọ ga-adịrị ndị ahụ na-abara onye ikpe mara mba na mma, ha ga-anatakwa ezi ngọzị. Ọsịsa ziri ezi bụ ihe na-egosi ikwesi ntụkwasị obi. Rụchaa ọrụ gị dị nʼezi. Dozie ala ubi gị. Emesịa wuoro onwe gị ụlọ. Agbala ama ụgha megide onye agbataobi gị nʼefu. Ọ bụ egbugbere ọnụ gị abụọ ka ị ga-eji ghọọ aghụghọ? Asịla, “Aga m emeso ha dịka ha siri meso m. Aga m akwụghachi ha ụgwọ ihe ha mere.” Esitere m nʼubi otu onye umengwụ gafee, bụ ubi vaịnị nke onye na-enweghị uche, hụ na ogwu etochiela ya, ahịhịa etochiekwala ya; mgbidi dị ya gburugburu adaakwala. Elegharịrị m ya anya site na ya mụta otu ihe a: Nwa ụra nta, nwa iru ụra nta, nwa ịchịkọba aka nta zuo ike ụbịam ga-abịakwasị gị dịka onye ohi, ụkọ abịakwasịkwa gị dịka onye na-apụnara mmadụ ihe.