ILU 23:19-35
ILU 23:19-35 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nwa m, nwee uche, gbasookwa ụzọ Chineke. Anọla nʼetiti ndị na-aṅụbiga mmanya oke, na ndị iri oke oriri na-atọ ụtọ, nʼihi na ihe niile ga-akọ ha. Ọ bụkwa nkịrịnka akwa ka onye oke ụra na-eyi nʼahụ. Ṅaa ntị nʼịdọ aka na ntị nna gị, akpọkwala ịdọ aka na ntị nne gị bụ agadi nwanyị asị. Zụta eziokwu, erekwala ya, zụtakwa amamihe, ntụziaka, na nghọta. Nna onye ezi omume ga-aṅụrị ọṅụ. Ọ bụkwa ihe oke ọṅụ inweta nwa maara ihe. Ka nne na nna gị nwee obi ụtọ. Ka onye mụrụ gị ṅụrịa. Nwa m, nye m obi gị ka ụzọ m niile nyekwa anya gị ọṅụ. Nʼihi na onye akwụna bụ olulu miri emi, nwanyị nwe di na-akwa iko bụ olulu mmiri dị warawara. Dịka onye ohi ka ọ na-echere na-emekwa ka ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi baa ụba nʼetiti ụmụ nwoke. Onye ka obi ya jupụtara nʼahụhụ? Onye nọ na iru ụjụ? Olee onye nwere esemokwu? Onye nwere ọtụtụ ihe mkpesa? Onye nwere mmerụ ahụ nke na-abaghị uru? Onye nwere anya nke na-acha ọbara ọbara? Ọ bụ ndị na-anọ ogologo oge na-aṅụ mmanya, onye na-aga ịchọpụta mmanya agwara agwa. Elekwasịla mmanya anya mgbe ọ na-acha ọbara ọbara, mgbe ọ na-ezipụta ọdịdị ya nʼiko mgbe ọ na-asụgharị nke ọma nʼime iko. Nʼikpeazụ, ọ na-ata dịka agwọ na-atụkwa dịka ajụala. Anya gị abụọ ga-ahụ ihe ị na-amaghị isi ya na ọdụ ya, obi gị ga-atụlekwa ihe ndị na-agbagwoju anya. Ị ga-adị ka onye na-edina nʼetiti oke osimiri, nke na-edinakwa nʼelu ụdọ nʼejide ụgbọ. Ị ga-asị, “Ha tiri m ihe, ma emerụghị m ahụ. Ha pịara m ihe, ma amaghị m. Olee mgbe m ga-eteta, ka m pụọ ga chọọ mmanya ọzọ?”
ILU 23:19-35 Bible Nso (IGBOB)
Nuru, gi onwe-gi, nwam, we mara ihe, Me kwa ka obi-gi gazi agazi n'uzọ. Anọla n'etiti ndi nāṅubiga manya-vine ókè; N'etiti ndi nēribiga anu ókè: N'ihi na onye nāṅubiga manya ókè na onye nēribiga ihe ókè ka agānapu ihe nile: Ọ bu kwa nkirika ákwà ka òrù-ura gēyikwasi madu. Ge nna-gi, bú onye muru gi, nti, Eleda-kwa-la nne-gi anya mb͕e o mere agadi. Zuta ezi-okwu, ere-kwa-la ya; E, amam-ihe, na idọ-aka-na-nti, na nghọta. Nna nke onye ezi omume gēteghari egwú ọṅù nke-uku: Onye nāmu kwa onye mara ihe gāṅuri ọṅu na ya. Ka nna-gi na nne-gi ṅuria, Ka nwanyi muworo gi teghari kwa egwú ọṅù. Nwam, nyem obi-gi, Ka uzọm nile tọ kwa anya-gi abua utọ. N'ihi na ọbù nke miri emi ka nwanyi nke nākwa iko bu; Olùlù nke di nkpà ka nwanyi nābughi nwunye-gi bu. E, nwanyi ahu nēche anwu dika onye nāpunara madu ihe, Ọzọ, ndi-nghọb͕u n'etiti madu ka ọ nēme ka ha ba uba kari. Ònye nwere ahuhu? ònye nwere iru-újú? ònye nwere ise-okwu? Ònye nwere ntamu? ònye nwere ob͕ub͕u-mma n'efu? Ònye nwere anya nācha ọbara-ọbara? Ọ bu ndi nānọ na manya-vine ogologo mb͕e; Ndi nābà n'ulo ichọputa manya agwara agwa. Elekwasila manya-vine anya mb͕e ọ nācha ọbara-ọbara, Mb͕e ọ nēnye udi-ya n'iko, Mb͕e ọ nāsughari n'iko nke-ọma: N'ikpe-azu-ya ọ bu dika agwọ ka ọ nāta, Ọ bu kwa dika aju-ala ka ọ nātu. Anya-gi abua gāhu ndinyom nābughi nwunye-gi, Obi-gi gēkwu kwa okwu ib͕akuta Chineke azu. I gādi kwa ka onye nēdina n'etiti oké osimiri, Ma-ọbu dika onye nēdina n'elu akpu-ub͕ọ. Ha etib͕uwom, ka i gāsi, ariaghm ọria; Ha apiawom ihe, amaghm: Òle mb͕e m'gēteta? m'gāchọ kwa ya ọzọ.