Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ILU 22:14-29

ILU 22:14-29 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ọnụ nwanyị na-akwa iko bụ oke olulu, nwoke nọ nʼokpuru oke iwe ONYENWE ANYị na-adaba nʼime ya. Obi ụmụntakịrị jupụtara nʼenweghị uche, ma apịpịa ịdọ aka na ntị ga-achụpụ ya nʼebe dị anya. Onye na-achọ uru site nʼimegbu onye na-enweghị ike, maọbụ onye na-enye ọgaranya onyinye ga-ebi nʼoke ụkọ. Lezie anya gee ntị nʼokwu niile nke ndị maara ihe, tinye uche gị nʼihe m na-akụzi. Ọ dị ụtọ ma idebe ha nʼobi gị, ma ha dịkwa nʼegbugbere ọnụ gị mgbe niile. Ọ bụ ka ntụkwasị obi gị dị nʼime ONYENWE ANYị, ya ka m na-akụziri gị taa, ọbụladị gị onwe gị. Ọ bụ na m edepụtabereghị gị iri ndụmọdụ atọ ndị a, bụ okwu ndụmọdụ na ihe ọmụma? Ha na-ezi gị ihe bụ ikwesi ntụkwasị obi na ikwu eziokwu. Mgbe ahụ ọ bụrụ na-ezie gị sị gị gaa chọta eziokwu ị ga-eji ezi ọsịsa lọghachi. Emegbula ogbenye nʼihi na ọ bụ ogbenye. Emegidekwala ya nʼụzọ ikpe. Nʼihi na ONYENWE ANYị ga-ekwuchitere ha ọnụ ha ma bibiekwa ndị na-emegide ha. Gị na onye na-ewe oke iwe abụla enyi, gị na onye na-ewe iwe ọsịịsọ emekọkwala ihe, ma ọ bụghị ya, i nwere ike ịmụta ndụ ha, si otu a tinye ndụ gị na nsogbu. Abụla onye otu nʼime ndị na-anara ndị mmadụ akaebe maọbụ kwee nkwa ikwu ụgwọ onye ọzọ ji. Nʼihi na ọ bụrụ na i nweghị ego ị ga-eji kwụọ ụgwọ ahụ, a ga-anapụ gị ọ bụladị ihe ndina gị. Ehigharịla oke ala e tinyere site na mgbe ochie. Nke ndị nna ochie gị ha hiwere. Ị hụrụ mmadụ ahụ nke nwere ǹka nʼịrụ ọrụ ya nke ọma? Ọ ga-eguzo nʼihu ndị eze, ọ gaghị eguzo nʼihu ndị a na-amaghị aha ha.

ILU 22:14-29 Bible Nso (IGBOB)

Ọbù nke miri emi ka ọnu ndinyom nābughi nwunye-gi bu: Onye Jehova nēwesa oké iwe gādabà nime ya. Uche b͕agọrọ ab͕agọ bu ihe ekekọtaworo n'obi nwata; Ma nkpa-n'aka nke idọ-aka-na-nti gēme ka ọ di anya n'ebe ọ nọ. Onye nēmeb͕u onye nēnweghi ike ime ka àkù nke aka ya ba uba, Ya na onye nēnye ọgaranya ihe gābiaru nání ihe-ukọ. Tọ nti-gi n'ala, nu okwu nile nke ndi mara ihe, Tukwasi kwa obi-gi n'ihe-ọmumam. N'ihi na ọ di utọ mb͕e i debe ha n'afọ-gi, Mb͕e ha gēguzosi ike n'otù n'elu eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua. Ọ bu ka ntukwasi-obi-gi we di na Jehova Ka m'meworo ka i mara ha ta, ọbuná gi onwe-gi. Èdetaghm i isi ihe Nime ndum-ọdu di iche iche na ihe-ọmuma; Ime ka i mara ikwesi-ntukwasi-obi nke okwu-ọnu nile nke ezi-okwu, Ka i we weghachiri ndi nēzite gi okwu-ọnu nile nke bu ezi-okwu? Anapula onye nēnweghi ike ihe n'ike, n'ihi na onye nēnweghi ike ka ọ bu, Azọpia-kwa-la onye ewedara n'ala n'ọnu-uzọ-ama: N'ihi na Jehova gēkpe ọnu-ha, We punara ndi ahu ndu, bú ndi nāpunara ha ihe. Gi na onye-iwe abula eyì; I gaghi-eso kwa onye-ọnuma ba n'ulo: Ka i we ghara imuta uzọ-ya nile, We wetara nkpuru-obi-gi ọnyà. Abula otù nime ndi gānara madu n'aka, Abu-kwa-la otù nime ndi nọ na mbe bayere ugwọ di iche iche. Ọ buru na i nweghi ihe ikwu ugwọ, N'ìhi gini ka ọ gānapu ihe-ndina-gi n'okpuru gi? Ewezugala ókè-ala nke diworo mb͕e ebighi-ebi, Nke nna-gi-hà kpaworo. Ì huwo madu nke nēme ngwa n'ije-ozi-ya? n'iru ndi-eze ka o gēguzo onwe-ya; Ọ gaghi-eguzo onwe-ya n'iru ndi anāmaghi aha-ha.