ILU 15:5-7
ILU 15:5-7 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Naanị onye nzuzu na-akpọ ndụmọdụ ndị mụrụ ya ihe efu; ma onye ọbụla na-ege ntị nye mgbanwe na-ezipụta ezi uche. Ụlọ ndị ezi omume na-ejupụta nʼọtụtụ akụ, ma akụ ndị na-emebi iwu na-ewetara ha nsogbu. Egbugbere ọnụ onye maara ihe na-agbasa ihe ọmụma, ma obi ndị nzuzu ezighị ezi.
Kesaa
Gụọ ILU 15ILU 15:5-7 Bible Nso (IGBOB)
Onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ nēlelì idọ-aka-na-nti nna-ya: Ma onye nāriba iba-nba ama gaghọ onye nwere ezi uche. N'ulo onye ezi omume ka ọtutu àkù di: Ma n'ihe-omume nke onye nēmebi iwu ka nmekpa-aru di. Eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi mara ihe nēfesa ihe-ọmuma: Ma obi ndi-nzuzu adighi-eme otú a.
Kesaa
Gụọ ILU 15