ILU 15:31-33
ILU 15:31-33 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Onye na-ege ntị nye ịba mba nke na-enye ndụ ga-esoro ndị amamihe nọrọ. Onye jụrụ ịdọ aka na ntị kpọrọ onwe ya asị ma onye ọbụla naara ndụmọdụ nwere nghọta. Ịtụ egwu ONYENWE ANYị bụ amamihe na-abịa site nʼịdọ aka na ntị; onye dị umeala nʼobi ga-anata ugwu na nsọpụrụ.
Kesaa
Gụọ ILU 15ILU 15:31-33 Bible Nso (IGBOB)
Nti nke nānu iba-nba nke ndu, N'etiti ndi mara ihe ka ọ gānọ ọnọdu-abali. Onye nēzere idọ-aka-na-nti nāju nkpuru-obi nke aka ya: Ma onye nānu iba-nba nēnweta obi amam-ihe. Egwù Jehova bu idọ-aka-na-nti nke amam-ihe; Ọ bu kwa n'iru nsọpuru ka obi ume-ala nāga.
Kesaa
Gụọ ILU 15