ILU 15:1-17
ILU 15:1-17 Bible Nso (IGBOB)
Ọziza-okwu di nrò nēme ka ọnuma laghachi azu: Ma okwu nwuta nākpali iwe. Ire ndi mara ihe nēme ka ihe-ọmuma di nma: Ma ọnu ndi-nzuzu nēkwuwa okwu uche b͕agọrọ ab͕agọ. N'ebe nile ọ bula ka anya abua nke Jehova di, Nēche ndi ọjọ na ndi bu ezi madu nche. Ire nke nāgwọ madu bu osisi nēnye ndu: Ma omume b͕agọrọ ab͕agọ nime ya bu ntipia nime mọ madu. Onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ nēlelì idọ-aka-na-nti nna-ya: Ma onye nāriba iba-nba ama gaghọ onye nwere ezi uche. N'ulo onye ezi omume ka ọtutu àkù di: Ma n'ihe-omume nke onye nēmebi iwu ka nmekpa-aru di. Eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi mara ihe nēfesa ihe-ọmuma: Ma obi ndi-nzuzu adighi-eme otú a. Àjà ndi nēmebi iwu bu ihe-árú n'anya Jehova: Ma ekpere ndi ziri ezi bu ihe nātọ Ya utọ. Ihe-árú n'anya Jehova ka uzọ onye nēmebi iwu bu: Ma onye nāb͕aso ezi omume ka Ọ nāhu n'anya. Idọ-aka-na-nti ọjọ diri onye nārapu uzọ: Onye nākpọ iba-nba asì gānwu. Ala-mọ na ebe-ila-n'iyì di n'iru Jehova? Òbi umu madu gēsi aṅa ghara idi n'iru Ya? Ọ dighi-atọ onye nākwa emò utọ ka abara ya nba: Ọ bughi onye mara ihe ka ọ gējekuru. Obi nke nāṅuri ọṅu nēme ka iru di nma: Ma eji ihe-nwuta nke obi tib͕ue mọ madu. Obi onye-nghọta nāchọ ihe-ọmuma: Ma ọnu ndi-nzuzu nāzù onwe-ya n'uche b͕agọrọ ab͕agọ dika anu-ulo. Ubọchi nile nke onye ewedara n'ala jọrọ njọ: Ma onye obi-ya di nma nēri oké oriri mb͕e nile. Ọ di nma inwe ihe ntà n'egwu Jehova, Kari inwe ọtutu àkù ma ọb͕ub͕a-aghara adi ya. Ọ di nma, bú òkè ihe-oriri nke bu nání akwukwọ nri, ma ihu-n'anya di n'ebe ahu, Kari ehi azùru azù ib͕u eb͕u, ma ikpọ-asì adi ya.
ILU 15:1-17 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ọsịsa okwu dị nro na-eme ka iwe na ọnụma laa azụ; ma okwu ike na-akpali iwe. Ire onye maara ihe na-eme ka ihe ọmụma mụbaa, ma ọnụ onye nzuzu na-ekwupụta okwu enweghị uche. ONYENWE ANYị na-ahụzu ihe niile, anya ya dịkwa nʼahụ ndị ọma na ndị ọjọọ. Okwu dị nwayọọ na-eweta ndụ na ume; ma nkwutọ na-eweta ịda mba. Naanị onye nzuzu na-akpọ ndụmọdụ ndị mụrụ ya ihe efu; ma onye ọbụla na-ege ntị nye mgbanwe na-ezipụta ezi uche. Ụlọ ndị ezi omume na-ejupụta nʼọtụtụ akụ, ma akụ ndị na-emebi iwu na-ewetara ha nsogbu. Egbugbere ọnụ onye maara ihe na-agbasa ihe ọmụma, ma obi ndị nzuzu ezighị ezi. ONYENWE ANYị na-akpọ aja ndị ajọ omume asị, ma ekpere ndị ndụ ha ziri ezi na-atọ ya ụtọ. ONYENWE ANYị kpọrọ ụzọ ndị na-emebi iwu asị, ma ndị na-achụso ezi omume ka ọ na-ahụ nʼanya. Oke ịdọ aka na ntị na-echere ndị na-ahapụ ụzọ. Onye kpọrọ ịba mba asị ga-anwụ ọnwụ. ONYENWE ANYị mazuru ihe omimi niile nke ọnwụ na ọkụ ala mmụọ; ọ ga-esikwa aṅaa ghara ịma obi ụmụ mmadụ? Ọ dịghị atọ onye na-akwa emo ụtọ ma a baara ya mba, ya mere ọ dịghị ejekwuru onye maara ihe. Obi nke na-aṅụrị ọṅụ na-eme ka ihu dị mma. Ihu gbarụrụ agbarụ na-egosi obi nwere ihe mwute. Obi nwere nghọta na-achọ ịmata ihe, ma ọnụ onye nzuzu na-azụ onwe ya nʼokwu na-abaghị uru. Ndụ onye ogbenye jupụtara nnọọ na mgbalị, ma ndị nwere udo nʼobi na-eri oriri mgbe niile. Ọ dị mma inwe akụnụba dị nta ma bụrụ onye na-atụ egwu ONYENWE ANYị, karịa inwe akụ ma nọrọ na nsogbu. Ọ ka mma bụ oke nri akwụkwọ nri nta nke nwere ịhụnanya, karịa ehi buru ibu a zụziri azụzi nke ịkpọ asị dị na ya.