ILU 11:16-31
ILU 11:16-31 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nsọpụrụ na-adịrị nwanyị nwere obiọma, ma ndị na-adịghị eme ebere bụ naanị akụnụba ka ha na-enweta. Onye nwere obiọma baara onwe ya uru, ma onye nwere obi ọjọọ na-ewetara onwe ya nsogbu. Onye ajọ omume na-anata ụgwọ ọrụ aghụghọ, ma onye na-agha ezi omume dịka mkpụrụ na-anata ụgwọ ọrụ kwesiri ekwesi. Onye na-eguzosi ike ime ihe ziri ezi ga-enwe ndụ; ma onye na-agbaso ihe ọjọọ ga-ahụ ọnwụ. ONYENWE ANYị na-akpọ ndị obi ha gbagọrọ agbagọ asị ma ndị ụzọ ha na-enweghị ihe ịta ụta na-amasị ya. Ọ bụ ihe doro anya na ndị na-emebi iwu ga-ata ahụhụ, ma ndị ezi omume ka a ga-anapụta. Nwanyị mara mma, nke na-enweghị uche, dịka ọlaedo a gbanyere ezi nʼimi. Olileanya onye ezi omume bụ ọṅụ, ma onye na-emebi iwu na-ele naanị anya ihe ọjọọ. Otu onye na-agbasapụ aka ya na-enye enye ma na-enweta akụ karịa, ma onye ọzọ na-egbochi egbochi ma na-ada ogbenye. E, onye na-agbasa aka ya ga-aba ọgaranya; onye ọbụla na-atụte ndị ọzọ ka a ga-atụtekwa. Ndị mmadụ na-abụ onye na-achịkọba mkpụrụ ọka na-ereghị ya ere ọnụ, ma ha na-ekpetara onye nke dị njikere ire nke ya ngọzị Chineke. Onye na-achọ ihe ọma na-enweta ihuọma, ma ihe ọjọọ na-abịakwasị onye na-achọ ya. Ndị tụkwasịrị obi nʼakụnụba ha ga-ada, ma onye ezi omume ga-epupụta dịka akwụkwọ ndụ. Onye na-ewetara ezinaụlọ ha nsogbu ga-eketa naanị ifufe, onye nzuzu ga-abụ ohu nke onye maara ihe. Mkpụrụ nke ndị ezi omume bụ osisi na-enye ndụ, onye na-erita mkpụrụobi nʼuru bụ onye maara ihe. Ọ bụrụ na a ga-akwụ ndị ezi omume ụgwọ ọrụ ha nʼụwa a; a ga-esi aṅaa ghara ịkwụ ndị na-amaghị Chineke na ndị mmehie ụgwọ ọrụ.
ILU 11:16-31 Bible Nso (IGBOB)
Nwayi amara nējidesi nsọpuru ike: Ndi nēme ka madu ma jijiji nējidesi kwa àkù ike. Onye nēmeso nkpuru-obi-ya ezi ihe ka onye-ebere bu: Ma onye nēmekpa anu-aru nke aka ya aru ka onye nēnweghi obi-ebere bu. Onye nēmebi iwu nāluta ego-ọlu okwu-ugha: Ma onye nāgha ezi omume dika nkpuru nāluta ugwọ-ọlu kwesiri ntukwasi-obi. Onye nēguzosi ike n'ezi omume gēru na ndu: Ma onye nāb͕aso ihe ọjọ gēru n'ọnwu nke aka ya. Ihe-árú n'anya Jehova ka ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'obi bu: Ma ihe nātọ Ya utọ ka ndi zuru okè n'uzọ-ha bu. Site n'aka rue aka, agaghi-agu onye ọjọ n'onye nēmeghi ihe ọjọ: Ma nkpuru ndi ezi omume gēwepuga onwe-ha. Dika nb͕a-aka ọla-edo n'imi ezì, Otú a ka nwanyi mara nma nke nēsi n'ezi uche wezuga onwe-ya di. Ihe ndi ezi omume nāchọsi ike bu nání ezi ihe: Ma olile-anya nke ndi nēmebi iwu bu nrubiga-ókè nke iwe. O nwere onye nāghasa aghasa, ma anọ̀ nātukwasiri ya ihe kari; O nwe-kwa-ra onye nēb͕ochi eb͕ochi kari nke ziri ezi, ma ọ nēdubà nání n'ikọ-ukọ. Nkpuru-obi nke nāgọzi agọzi ka agēme ka ọ ma abuba: Ọzọ, onye nēme ka ndi ọzọ ṅujue afọ, agēme kwa ka ya onwe-ya ṅujue afọ. Onye nēb͕uchi ọka, ọra madu gākọcha ya: Ma ngọzi n'isi onye nēre ya. Onye nāchọsi ezi ihe ike nāchọ ka ihe-ya nātọ Chineke utọ: Ma onye nāchọ ihe ọjọ, ihe ahu gābiakute ya. Onye nātukwasi obi n'àkù-ya, onye ahu gāda: Ma dika akwukwọ ndu ka ndi ezi omume gēpú. Onye nēmekpa èzí-na-ulo-ya aru gēketa ifufe: Orù ka onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya gābu-kwa-ra onye obi-ya mara ihe. Nkpuru onye ezi omume nāmi bu osisi nēnye ndu; Onye nēnwetara Chineke nkpuru-obi madu ka onye mara ihe bu. Le, agākwughachi onye ezi omume ugwọ n'uwa: Àgēsi kwa aṅa ghara ikwughachi onye nēmebi iwu na onye-nmehie?