ILU 11:1-15
ILU 11:1-15 Bible Nso (IGBOB)
Ihe-osìsì aghughọ bu ihe-árú n'anya Jehova: Ma nkume-isì-ihe zuru ezu bu ihe nātọ Ya utọ. Nganga bia, nlelì abia kwa: Ma n'ebe ndi di ume-ala n'obi nọ ka amam-ihe di. Izu-okè nke ndi ziri ezi nēdu ha: Ma omume b͕agọrọ nke ndi nāghọb͕u aghọb͕u gēmebi ha. Àkù adighi-aba urù n'ubọchi nke nrubiga-ókè nke iwe: Ma ezi omume nānaputa n'ọnwu. Ezi omume nke onye zuru okè gēme ka uzọ-ya zie ezi: Ma nmebi-iwu nke aka ya ka onye nēmebi iwu gēji da. Ezi omume nke ndi ziri ezi gānaputa ha: Ma n'ọchichọ nke ha nāchọsi ike ka agānwude ndi nāghọb͕u aghọb͕u. Mb͕e madu nke nēmebi iwu nwuru, olile-anya-ya gāla n'iyì: Ọzọ, nchere nke ajọ ihe nile alawo n'iyì. Adọputawo onye ezi omume n'ahuhu, Onye nēmebi iwu ba n'ọnọdu ya. Ọnu-ya ka onye emeruru emeru ji ebibi madu-ibe-ya: Ma ihe-ọmuma ka agēji dọputa ndi ezi omume. N'ọdi-nma nke ndi ezi omume obi ndi obodo-ha nātọ ha utọ: Ọzọ, mb͕e ndi nēmebi iwu nāla n'iyì, iti-nkpu-ọṅù di. Eji ngọzi nke ndi ziri ezi bulie obodo: Ma eji ọnu ndi nēmebi iwu akwada ya. Onye nēleda madu-ibe-ya anya, obi amam-ihe kọrọ ya: Ma onye-nghọta nāb͕a nkiti. Onye nējeghari dika onye nāb͕a àmà ọjọ nēkpughe ìzù nzuzo: Ma onye mọ-ya kwesiri ntukwasi-obi nēkpuchi okwu. Mb͕e ọ nādighi ezi ndum-ọdu ọ bula di, ndi ahu gāda: Ma nzọputa di n'ọtutu ndi nādu ọdu. Aghaghi imejọ madu, mb͕e ọ nọworo onye ala ọzọ na mbe: Ma onye nākpọ ndi nānara madu n'aka ibu ndi-mbe asì, ọ nọ na ntukwasi-obi.
ILU 11:1-15 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ihe ọtụtụ aghụghọ bụ arụ nʼihu ONYENWE ANYị ma ihe ọtụtụ zuru ezu na-anata ihuọma nʼebe ọ nọ. Nganga bịa, nlelị a na-eso ya, ma onye dị umeala nʼobi na-amụta ihe. Eziokwu nke ndị ziri ezi nʼobi na-edu ha; ma omume gbagọrọ agbagọ nke ndị aghụghọ nʼala ha nʼiyi. Akụnụba gị agaghị azọpụta gị nʼụbọchị ikpe; ọ bụ naanị ezi omume na-anapụta site nʼọnwụ. Ezi omume nke ndị na-enweghị ịta ụta na-eme ka ụzọ ha zie ezi, ma ajọ omume nke ndị na-emebi iwu na-akwada ha. Ezi omume nke onye ziri ezi na-azọpụta ya; ma ọchịchọ ọjọọ nke ndị na-aghọ aghụghọ ka a ga-eji jide ha. Mgbe onye ajọ omume nwụrụ, olileanya ya niile alala nʼiyi, ihe niile ọ na-ele anya inweta site nʼike ya alaakwala nʼiyi. Chineke na-azọpụta ndị ezi omume site na nsogbu ha, ma ndị ajọ omume ka ọ na-ahapụ ka ha daba nʼime ya. Okwu ọjọọ ka onye ajọ omume ji emebi onye agbataobi ya. Ma site nʼihe ọmụma ka onye ezi omume ga-eji dọpụta ndụ ya. Ọganihu nke onye ezi omume na-atọ mmadụ niile ụtọ, otu aka ahụ kwa, ọnwụ onye ajọ omume na-atọ mmadụ niile ụtọ. A na-esite na ngọzị nke ndị ziri ezi bulie obodo elu, ma a nʼala ya nʼiyi site nʼokwu ọnụ ndị ajọ omume. Ikwu okwu nleda megide onye agbataobi gị bụ nzuzu; ma onye ahụ nwere nghọta na-agba nkịtị. Onye na-agba asịrị na-ekpughe ihe nzuzo, ma onye kwesiri ntụkwasị obi na-ekpuchi ihe nzuzo. Nʼihi enweghị ezi ndị ndu ka obodo ji ada, ma ọtụtụ ndị ezi ndụmọdụ na-eweta mmeri. Onye ọbụla na-ana onye ọbịa nʼakaebe ga-ata ahụhụ, ma onye jụrụ ịkwụ ụgwọ onye ọzọ ji, nọ na ntụkwasị obi.