ILU 1:8-19
ILU 1:8-19 Bible Nso (IGBOB)
Nwam, nuru idọ-aka-na-nti nke nna-gi, Arapu-kwa-la iwu nne-gi: N'ihi na okpu amara ka ha gāburu isi-gi, Ihe-inya-n'olu ka ha gāburu olu-gi. Nwam, ọ buru na ndi-nmehie arà gi urà, Ekwela. Ọ buru na ha asi, Soro ayi je, Ka ayi che anwu ọbara, Ka ayi zobe onwe-ayi ijide onye nēmeghi ihe ọjọ n'efu; Ka ayi lo ha na ndu dika ala-mọ, Bú ndi zuru okè, dika ndi nārida n'olùlù; Ihe nile di oké ọnu-ahia ka ayi gāchọta, Ayi gākwaju ulo-ayi nile n'ihe ayi kwatara n'agha; Nzà-gi ka i gēfe n'etiti ayi; Otù akpa-ego ka ayi nile gēnwekọ: Nwam, esola ha je n'uzọ; B͕ochie ukwu-gi n'iga n'okporo-uzọ-ha: N'ihi na ukwu-ha nāb͕a ọsọ ime ihe ọjọ, Ha nēme kwa ngwa iwusi ọbara. N'ihi na ọ bu n'efu ka anāb͕asa ub͕u, N'anya nnunu ọ bula: Ndia Kwa, ọbara onwe-ha ka ha nēche anwu, Ha nēzobe onwe-ha inwude ndu nke aka ha. Otú a ka uzọ nile nke onye ọ bula nke akpiri urù nēzighi ezi nākpọ nku si di; Ndu nke ndi-nwe-ya ka ọ nēwepu.
ILU 1:8-19 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nwa m, na-aṅa ntị na ntụziaka nke nna gị ahapụkwala ndụmọdụ nne gị. Nʼihi na okpu amara ka ha ga-abụrụ isi gị, bụrụkwa ihe ịnya nʼolu nye gị. Nwa m, ọ bụrụ na ndị mmehie ara gị ụra, ekwenyerela ha, Ekwela! Ọ bụrụ na ha asị gị, “Bịa soro anyị; ka anyị zoo onwe anyị, tigbuo onye ọbụla anyị hụrụ, bụ onye na-emeghị ihe ọjọọ ọbụla. Ka anyị loo ha na ndụ, dịka ala ili, loo ha kpamkpam dịka ndị na-arịda nʼolulu. Anyị ga-enwetakwa ọtụtụ ihe dị oke ọnụahịa, nke anyị ga-akwaju nʼụlọ anyị. Soro anyị fee nza gị ka anyị nwaa ike anyị, ihe ọbụla kwa anyị nwetara, anyị na gị ga-ekekọta ya ọnụ.” Nwa m, ejela ije nʼụzọ ndị dị otu a, a zọọkwala ụkwụ nʼokporoụzọ ha; nʼihi na ụkwụ ha na-agba ọsọ ime ihe ọjọọ, na-emekwa ngwangwa iwufu ọbara. Ọ bụ ihe abaghị uru ịgbasa ụgbụ, nʼebe nnụnụ ọbụla na-ahụ ya anya. Ma ndị a na-esi ọnya nke na-ama ha. Ha onwe ha ka ọnya ahụ ga-ejide. Otu a ka ọ na-adịkwara ndị ọ na-agụsị agụụ ike inweta akụnụba nʼụzọ na-ezighị ezi. Nʼihi na ịgbaso ụzọ dị otu a na-ewetara ndị na-eso ya ọnwụ.