Nwa m, na-aṅa ntị na ntụziaka nke nna gị ahapụkwala ndụmọdụ nne gị. Nʼihi na okpu amara ka ha ga-abụrụ isi gị, bụrụkwa ihe ịnya nʼolu nye gị. Nwa m, ọ bụrụ na ndị mmehie ara gị ụra, ekwenyerela ha, Ekwela! Ọ bụrụ na ha asị gị, “Bịa soro anyị; ka anyị zoo onwe anyị, tigbuo onye ọbụla anyị hụrụ, bụ onye na-emeghị ihe ọjọọ ọbụla. Ka anyị loo ha na ndụ, dịka ala ili, loo ha kpamkpam dịka ndị na-arịda nʼolulu. Anyị ga-enwetakwa ọtụtụ ihe dị oke ọnụahịa, nke anyị ga-akwaju nʼụlọ anyị. Soro anyị fee nza gị ka anyị nwaa ike anyị, ihe ọbụla kwa anyị nwetara, anyị na gị ga-ekekọta ya ọnụ.” Nwa m, ejela ije nʼụzọ ndị dị otu a, a zọọkwala ụkwụ nʼokporoụzọ ha; nʼihi na ụkwụ ha na-agba ọsọ ime ihe ọjọọ, na-emekwa ngwangwa iwufu ọbara. Ọ bụ ihe abaghị uru ịgbasa ụgbụ, nʼebe nnụnụ ọbụla na-ahụ ya anya. Ma ndị a na-esi ọnya nke na-ama ha. Ha onwe ha ka ọnya ahụ ga-ejide. Otu a ka ọ na-adịkwara ndị ọ na-agụsị agụụ ike inweta akụnụba nʼụzọ na-ezighị ezi. Nʼihi na ịgbaso ụzọ dị otu a na-ewetara ndị na-eso ya ọnwụ.
Gụọ Ilu 1
Geere nke a ntị Ilu 1
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Ilu 1:8-19
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị