ỌNU-ỌGUGU 33:1-39
ỌNU-ỌGUGU 33:1-39 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ndị a bụ usoro mbili ije ụmụ Izrel, site nʼoge ha hapụrụ Ijipt dịka ha si nọọ nʼigwe nʼigwe. Ọ bụ Mosis na Erọn duuru ha nʼije ndị a. Mosis, nʼonwe ya, dere usoro ije ha ndị a nʼakwụkwọ dịka ONYENWE ANYị nyere ya nʼiwu. Ha biliri njem site na Ramesis, nʼụbọchị nke iri na ise nʼọnwa nke mbụ, ụbọchị na-esota nke e mere Mmemme Ngabiga. Ha niile zọpụrụ ije nʼatụghị egwu nʼihu ndị Ijipt, mgbe ndị ha nọ na-eli ụmụ ha niile ndị e buru ụzọ mụọ, bụ ndị ONYENWE ANYị tigburu nʼetiti ha nʼihi na ONYENWE ANYị kpere chi ha niile ikpe. Ndị Izrel hapụrụ Ramesis, bịa maa ụlọ ikwu ha na Sukọt. Ha hapụrụ Sukọt bịaruo Etam, nke dị nʼọnụ ọnụ ọzara ahụ. Ha hapụrụ Etam laghachi azụ gaa Pi Hahirot, nke dị nso nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Baal-Zefọn, ebe ha manyere ụlọ ikwu ha na ndịda ugwu Migdol. Mgbe ha hapụrụ Pi Hahirot, ha sitere nʼetiti Osimiri Uhie gafee gaa ije ụbọchị atọ bata nʼọzara Etam. Ha manyere ụlọ ikwu ha na Mara. Mgbe ha hapụrụ Mara, ha batara Elim, ebe e nwere mmiri iri na abụọ si nʼala na-asọpụta, na iri osisi nkwụ asaa. Ha nọrọ ọdụ dị ukwuu nʼebe a. Mgbe ha hapụrụ Elim, ha wuru ụlọ ikwu ha nʼakụkụ Osimiri Uhie. Emesịa, ha hapụrụ Osimiri Uhie gaa maa ụlọ ikwu ha nʼọzara a na-akpọ Sin. Ha hapụrụ ọzara Sin gaa maa ụlọ ikwu ha na Dofka. Emesịa, ha hapụrụ Dofka bịaruo Alush maa ụlọ ikwu ha. Mgbe ha hapụrụ Alush, ha rutere Refidim, ebe ndị Izrel na-ahụghị mmiri ọṅụṅụ. Ha hapụrụ Refidim bịaruo nʼọzara Saịnaị ebe ha mara ụlọ ikwu ha. Ha hapụrụ ọzara Saịnaị bịaruo Kibrọt Hataava ebe ha mara ụlọ ikwu ha. Ha hapụrụ Kibrọt Hataava bịaruo Hazerọt ebe ha mara ụlọ ikwu ha. Ha hapụrụ Hazerọt bịaruo Ritma ebe ha mara ụlọ ikwu ha. Ha hapụrụ Ritma bịaruo Rimon-Perez ebe ha mara ụlọ ikwu ha. Ha hapụrụ Rimon-Perez bịaruo Libna ebe ha mara ụlọ ikwu ha. Ha hapụrụ Libna bịaruo Rissa ebe ha mara ụlọ ikwu ha. Ha hapụrụ Rissa bịaruo Kehelata ebe ha mara ụlọ ikwu ha. Ha hapụrụ Kehelata bịaruo nʼugwu Shefa ebe ha mara ụlọ ikwu ha. Ha hapụrụ ugwu Shefa bịaruo Harada ebe ha mara ụlọ ikwu ha. Ha hapụrụ Harada bịaruo Makhelot ebe ha mara ụlọ ikwu ha. Ha hapụrụ Makhelot bịaruo Tahat ebe ha mara ụlọ ikwu ha. Ha hapụrụ Tahat bịaruo Tera ebe ha mara ụlọ ikwu ha. Ha hapụrụ Tera bịaruo Mitka ebe ha mara ụlọ ikwu ha. Ha hapụrụ Mitka bịaruo Hashmona ebe ha mara ụlọ ikwu ha. Ha hapụrụ Hashmona bịaruo Moserot ebe ha mara ụlọ ikwu ha. Ha hapụrụ Moserot bịaruo Bene Jaakan ebe ha mara ụlọ ikwu ha. Ha hapụrụ Bene Jaakan bịaruo Họ Hagịdgad ebe ha mara ụlọ ikwu ha. Ha hapụrụ Họ Hagịdgad bịaruo Jotbata ebe ha mara ụlọ ikwu ha. Ha hapụrụ Jotbata bịaruo Abrona ebe ha mara ụlọ ikwu ha. Ha hapụrụ Abrona bịaruo Eziọn Geba ebe ha mara ụlọ ikwu ha. Ha hapụrụ Eziọn Geba bịa maa ụlọ ikwu ha na Kadesh, nke dị nʼọzara Zin. Ha hapụrụ Kadesh bịa maa ụlọ ikwu ha nʼugwu Hor nʼoke ala ndị Edọm. Erọn, bụ onye nchụaja gbagoro nʼugwu Hor site nʼiwu ONYENWE ANYị. Nʼebe ọ nọ nwụọ, nʼụbọchị mbụ nke ọnwa nke ise, nʼafọ nke iri anọ site na mgbe ụmụ Izrel si Ijipt pụta. Erọn gbara narị afọ na iri afọ abụọ na atọ mgbe ọ nwụrụ nʼugwu Hor.
ỌNU-ỌGUGU 33:1-39 Bible Nso (IGBOB)
Ndia bu nbuli-ije umu Israel, ndi siri n'ala Ijipt puta, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di, n'aka Moses na Eron. Moses we de ọpupu nile ha n'akwukwọ dika nbuli-ije nile ha si di, n'okwu-ọnu Jehova: ndia bu kwa nbuli-ije-ha dika ọpupu nile ha si di. Ha we si na Rameses bulie ije n'ọnwa mbu, n'ubọchi nke-iri-na-ise nke ọnwa mbu ahu; n'echi nke ngabiga ahu ka umu Israel siri n'Ijipt puta n'aka di elu n'anya ndi Ijipt nile, mb͕e ndi Ijipt nēlì ndi Jehova tib͕uru n'etiti ha, bú ndi nile eburu uzọ mu: ọ bu kwa n'aru ndi bu chi-ha ka Jehova mere ihe nile O kpere n'ikpe. Umu Israel we si na Rameses bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Sukot. Ha si na Sukot bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Itam, nke di n'usọ ọzara. Ha si n'Itam bulie ije, jeghachi rue Pai-hahairot, nke di n'iru Beal-zefon: ha ma ulo-ikwū-ha n'iru Migdol. Ha si n'iru Hahairot bulie ije, gabiga n'etiti oké osimiri ba n'ọzara: ha je ije nke ubọchi atọ n'ọzara Itam, ma ulo-ikwū-ha nime Mara. Ha si na Mara bulie ije, biarue Ilim: isi-iyi miri iri na abua na ọgu nkwu atọ na iri di kwa n'Ilìm; ha we ma ulo-ikwū-ha n'ebe ahu. Ha si n'Ilim bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'akuku Oké Osimiri Uhie. Ha si n'Oké Osimiri Uhie bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ọzara Sin. Ha si n'ọzara Sin bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Dọfka. Ha si na Dọfka bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Alush. Ha si n'Alush bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Refidim, ebe ndi Israel nēnweghi miri iṅu. Ha si na Refidim bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ọzara Sainai. Ha si n'ọzara Sainai bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Kibrot-hataava. Ha si na Kibrot-hataava bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Hazerot. Ha si na Hazerot bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Ritma. Ha si na Ritma bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Rimon-perez. Ha si na Rimon-perez bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Libna. Ha si na Libna bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Risa. Ha si na Risa bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Kehilata. Ha si na Kehilata bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ugwu Shefa. Ha si n'ugwu Shefa bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Harada. Ha si na Harada bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Makhilot. Ha si na Makhilot bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Tahat. Ha si na Tahat bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Tera. Ha si na Tera bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Mitka. Ha si na Mitka bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Hashmona. Ha si na Hashmona bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Mosirot. Ha si na Mosirot bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Beni-jaakan. Ha si na Beni-jaakan bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Hoa-hagidgad. Ha si na Hoa-hagidgad bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Jọtbata. Ha si na Jọtbata bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Abrona. Ha si n'Abrona bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Ezion-geba. Ha si n'Ezion-geba bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ọzara Zin (nke ahu bu Kedesh). Ha si na Kedesh bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ugwu Hoa, na nsọtu ala Edom. Eron, bú onye-nchu-àjà, we rigo n'ugwu Hoa n'okwu ọnu Jehova, nwua n'ebe ahu, n'arọ nke-ọgu-abua site na mb͕e umu Israel siri n'ala Ijipt puta, n'ọnwa nke-ise, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu. Eron we b͕a ọgu arọ isi na atọ mb͕e ọ nwuru n'ugwu Hoa.