Ndia bu nbuli-ije umu Israel, ndi siri n'ala Ijipt puta, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di, n'aka Moses na Eron. Moses we de ọpupu nile ha n'akwukwọ dika nbuli-ije nile ha si di, n'okwu-ọnu Jehova: ndia bu kwa nbuli-ije-ha dika ọpupu nile ha si di. Ha we si na Rameses bulie ije n'ọnwa mbu, n'ubọchi nke-iri-na-ise nke ọnwa mbu ahu; n'echi nke ngabiga ahu ka umu Israel siri n'Ijipt puta n'aka di elu n'anya ndi Ijipt nile, mb͕e ndi Ijipt nēlì ndi Jehova tib͕uru n'etiti ha, bú ndi nile eburu uzọ mu: ọ bu kwa n'aru ndi bu chi-ha ka Jehova mere ihe nile O kpere n'ikpe. Umu Israel we si na Rameses bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Sukot. Ha si na Sukot bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Itam, nke di n'usọ ọzara. Ha si n'Itam bulie ije, jeghachi rue Pai-hahairot, nke di n'iru Beal-zefon: ha ma ulo-ikwū-ha n'iru Migdol. Ha si n'iru Hahairot bulie ije, gabiga n'etiti oké osimiri ba n'ọzara: ha je ije nke ubọchi atọ n'ọzara Itam, ma ulo-ikwū-ha nime Mara. Ha si na Mara bulie ije, biarue Ilim: isi-iyi miri iri na abua na ọgu nkwu atọ na iri di kwa n'Ilìm; ha we ma ulo-ikwū-ha n'ebe ahu. Ha si n'Ilim bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'akuku Oké Osimiri Uhie. Ha si n'Oké Osimiri Uhie bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ọzara Sin. Ha si n'ọzara Sin bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Dọfka. Ha si na Dọfka bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Alush. Ha si n'Alush bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Refidim, ebe ndi Israel nēnweghi miri iṅu. Ha si na Refidim bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ọzara Sainai. Ha si n'ọzara Sainai bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Kibrot-hataava. Ha si na Kibrot-hataava bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Hazerot. Ha si na Hazerot bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Ritma. Ha si na Ritma bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Rimon-perez. Ha si na Rimon-perez bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Libna. Ha si na Libna bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Risa. Ha si na Risa bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Kehilata. Ha si na Kehilata bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ugwu Shefa. Ha si n'ugwu Shefa bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Harada. Ha si na Harada bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Makhilot. Ha si na Makhilot bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Tahat. Ha si na Tahat bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Tera. Ha si na Tera bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Mitka. Ha si na Mitka bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Hashmona. Ha si na Hashmona bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Mosirot. Ha si na Mosirot bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Beni-jaakan. Ha si na Beni-jaakan bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Hoa-hagidgad. Ha si na Hoa-hagidgad bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Jọtbata. Ha si na Jọtbata bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Abrona. Ha si n'Abrona bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Ezion-geba. Ha si n'Ezion-geba bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ọzara Zin (nke ahu bu Kedesh). Ha si na Kedesh bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ugwu Hoa, na nsọtu ala Edom. Eron, bú onye-nchu-àjà, we rigo n'ugwu Hoa n'okwu ọnu Jehova, nwua n'ebe ahu, n'arọ nke-ọgu-abua site na mb͕e umu Israel siri n'ala Ijipt puta, n'ọnwa nke-ise, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu. Eron we b͕a ọgu arọ isi na atọ mb͕e ọ nwuru n'ugwu Hoa.