ỌNU-ỌGUGU 13:1-25
ỌNU-ỌGUGU 13:1-25 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
ONYENWE ANYị gwara Mosis okwu sị ya, “Ziga ụfọdụ ndị ikom ka ha gaa legharịa anya nʼala Kenan, ala ahụ m na-enye Izrel. Ziga mmadụ iri na abụọ, otu onyendu site nʼebo Izrel ọbụla.” Ya mere, dịka iwu ONYENWE ANYị nyere ya si dị, Mosis zipụrụ ha site nʼọzara Paran. Ha niile bụ ndị ndu nʼetiti ụmụ Izrel. Nke a bụ aha ha: Site nʼebo Ruben, Shamua nwa Zakua, Shafat nwa Hori, onye si nʼebo Simiọn. Kaleb nwa Jefune, onye si nʼebo Juda. Igal nwa Josef, onye si nʼebo Isaka. Hoshea nwa Nun, onye si nʼebo Ifrem Palti nwa Rafu, onye si nʼebo Benjamin. Gadiel nwa Sodi, onye si nʼebo Zebụlọn. Gadi nwa Susi, onye sitere nʼebo Manase (ya bụ ebo Josef). Amiel nwa Gemali, onye si nʼebo Dan. Setua nwa Maikel, onye si nʼebo Asha. Nabi nwa Vofusi, onye si nʼebo Naftalị. Geuel nwa Maki, onye si nʼebo Gad. Ndị a bụ aha ndị ikom ndị ahụ Mosis zipụrụ inyocha ala ahụ. (Ọ bụ nʼoge a ka Mosis gbanwere aha Hoshea nwa Nun, ka ọ bụrụ Joshua.) Mosis zipụrụ ha ịga ledoo ala Kenan, ọ sịrị, “Gbagoonụ site nʼụzọ Negev gakwanụ nʼala ugwu ugwu. Letanụ otu ala ahụ dị. Chọpụtanụ ụdị ndị bi nʼime ya, ma ha dị ike ma ha bụ ndị na-adịghị ike, ma ha dị ọtụtụ ma ha dị ole na ole. Letanụ ụdị ala ha bi nʼime ya, ma ọ dị mma ma ọ jọrọ njọ. Chọpụtanụ ụdị obodo dị nʼebe ahụ, ma ha bụ obodo mgbidi na-adịghị gburugburu ha, ma ha bụ obodo e wusiri ike. Letanụ otu ala ahụ dị. Ọ na-epupụta ihe ka ọ bụ ala ụkpa? Letanụ ma ha nwere ọtụtụ osisi ka ọ bụ na osisi adịghị nʼime ya. Gbalịanụ ka unu weta ụfọdụ nʼime mkpụrụ osisi dị nʼala ahụ.” (Ọ bụ oge mkpụrụ mbụ nke osisi vaịnị.) Ya mere ndị a gara ledoo ala ahụ anya site nʼọzara Zin ruo na Rehob, nke dị nso na Lebo Hamat. Ha gara site na Negev rute Hebrọn, ebe Ahiman na Sheshai na Talmai, ụmụ ụmụ Anak bi. (Ma ewuru Hebrọn afọ asaa tupu e wuo obodo Zoan dị nʼIjipt.) Mgbe ha rutere Ndagwurugwu Eshkọl, ha gbutere otu alaka osisi vaịnị nke nwere ụyọkọ mkpụrụ vaịnị. Mmadụ abụọ butere ya nʼosisi tinyere ụfọdụ mkpụrụ osisi pomegranet na fiig. A kpọrọ ebe ahụ Ndagwurugwu Eshkọl, nʼihi ụyọkọ mkpụrụ osisi vaịnị ndị Izrel gbutere nʼebe ahụ. Mgbe iri abalị anọ gasịrị, ndị nledo a sitere nʼije ha lọghachi.
ỌNU-ỌGUGU 13:1-25 Bible Nso (IGBOB)
Jehova we gwa Moses okwu, si, Zigara onwe-gi ndikom, ka ha we ledo ala Kenean, nke Mu onwem nēnye umu Israel: otù nwoke otù nwoke diri ebo nna-ya-hà ka unu gēziga, onye ọ bula, ọ buru onye-isi n'etiti ha. Moses we si n'ọzara Peran ziga ha n'okwu-ọnu Jehova: ha nile bu ndikom, ndi-isi umu Israel ka ha bu. Ndia bu aha-ha: nke diri ebo Reuben bu Shamua nwa Zakua. Nke diri ebo Simeon bu Shefat nwa Hori. Nke diri ebo Juda bu Keleb nwa Jefune. Nke diri ebo Isaka bu Igal nwa Josef. Nke diri ebo Efraim bu Hoshia nwa Nun. Nke diri ebo Benjamin bu Palti nwa Rafu. Nke diri ebo Zebulun bu Gadiel nwa Sodi. Nke diri ebo Josef, nke ahu bu, nke diri ebo Manase, bu Gadi nwa Susi. Nke diri ebo Dan bu Amiel nwa Gemali. Nke diri ebo Asha bu Setua nwa Maikael. Nke diri ebo Naftali bu Nahbi nwa Vọfsi. Nke diri ebo Gad bu Geuel nwa Maki. Ndia bu aha ndikom ahu nke Moses zigara iledo ala ahu. Moses we kpọ Hoshia nwa Nun Joshua. Moses we ziga ha iledo ala Kenean, ọ si ha, Rigonu n'uzọ a nime Negeb, rigo-kwa-nu n'ugwu: we hu ala ahu, ihe ọ bu; na ndi ahu ndi bi na ya, ma ọ bu ndi di ike ka ha bu, ma-ọbu ndi nādighi ike, ma ọ bu madu ole-na-ole ka ha di, ma-ọbu ọtutu madu; na ihe ala ahu bu nke ndi ahu nēbi nime ya, ma ọ bu ezi ala ka ọ bu ma-ọbu ala ọjọ; na ihe obodo nile bu nke ndi ahu nēbi nime ha, ma ọ bu na ha bi n'ọmuma-ulo-ikwū, ma-ọbu n'ebe ewusiri ike; na ihe ala ahu bu, ma ọ bu ala nwere ume ka ọ bu ma-ọbu ala nātà ihe, ma osisi di nime ya, ma-ọbu na ọ dighi. Me kwa onwe-unu ka unu di ike, weta kwa ufọdu nime nkpuru ala ahu. Ma mb͕e ahu bu mb͕e nke nkpuru mbu nke nkpuru-vine. Ha we rigo, ledo ala ahu site n'ọzara Zin rue Rehob, na nbata Hemat. Ha we rigo nime Negeb, biarue Hebron; ma n'ebe ahu ka Ahiman na Sheshai na Talmai, bú umu Anak, nọ (Ma ewuru Hebron arọ asa tutu ewue Zoan n'Ijipt.) Ha we biarue ndagwurugwu Eshkol, si n'ebe ahu b͕utu otù alaka na otù uyọkọ nkpuru-vine; ha we būru ya n'osisi eji ebu ihe n'etiti madu abua; ha weta-kwa-ra ufọdu nime nkpuru pomegranate na ufọdu nime nkpuru fig. Akpọrọ ebe ahu ndagwurugwu Eshkol, n'ihi uyọkọ nke umu Israel si n'ebe ahu b͕utu. Ha we si n'iledo ala ahu lata n'ọgwugwu ọgu ubọchi abua.