MAK 8:34-35
MAK 8:34-35 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ahụ, ọ kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya na igwe mmadụ ahụ. Ọ gwara ha sị, “Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ iso m, ya gụọ ndụ ya dị ka ihe furu efu. Mgbe ahụ, ya buru obe ya soro m nʼazụ. Nʼihi na onye na-azọ ndụ ya ka ọ ga-efunarị, ma onye ọbụla gụrụ ndụ ya dị ka ihe furu efu nʼihi m, na nʼihi oziọma m, ga-azọpụta ya.
Kesaa
Gụọ MAK 8MAK 8:34-35 Bible Nso (IGBOB)
O we kpọ ìgwè madu ahu, ha na ndi nēso uzọ-Ya, ka ha biakute Ya, Ọ si ha, Ọ buru na onye ọ bula achọ ka o som n'azu, ya ju onwe-ya, buli kwa obe-ya, nēsokwam. N'ihi na onye ọ bula nke nāchọ izọputa ndu-ya, ọ gētufu ya; ma onye ọ bula nke gētufu ndu-ya n'ihim na n'ihi ozi ọma nkem, ọ gāzọputa ya.
Kesaa
Gụọ MAK 8