Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

MAK 8

8
1Na mb͕e ahu, mb͕e oké ìgwè madu di kwa ọzọ, mb͕e ha nēnweghi kwa ihe ha gēri, Ọ kpọrọ ndi nēso uzọ-Ya ka ha biakute Ya, si ha, 2Enwerem ọmiko n'aru ìgwè madu a, n'ihi na Mu na ha nọgidere ubọchi atọ ub͕u a, ha enweghi kwa ihe ha gēri: 3ọ buru kwa na ezilagam ha n'ulo-ha n'ọnu efu, ha gāda #mbà n'uzọ; ufọdu nime ha si kwa n'ebe di anya bia. 4Ndi nēso uzọ-Ya we za Ya, si, Ọle ebe ka madu gēsi pu inwe ob͕e achicha inyeju ndia afọ nime ọhia ebe a? 5O we jua ha, si, Ùnu nwere ob͕e achicha ole? Ha we si, Asa. 6O we gwa ìgwè madu ahu ka ha nọdu ala: O we nara ob͕e achicha asa ahu; mb͕e O kelesiri ekele, Ọ nyawa ha, we nēnye ndi nēso uzọ-Ya, ka ha debe n'iru ha; ha we debe ha n'iru ìgwè madu ahu. 7Ha nwe-kwa-ra azù ntà ole-na-ole: O we gọzie ha, si ka edebe kwa ndia n'iru ha. 8Ha we rie, afọ ju kwa ha: ha we tutukọ iberibe fọduru, abọ asa. 9Ma ndi ahu ra ka nnù iri: O we zilaga ha. 10Ngwa ngwa Ya na ndi nēso uzọ-Ya we ba n'ub͕ọ-ha, bia n'akuku Dalmanuta.
11Ndi-Farisi we puta, malite iju Ya ajuju, nāchọ ihe-iriba-ama n'aka-Ya site n'elu-igwe, n'inwa Ya. 12O we sua udè nke-uku na mọ-Ya, si, Gini mere ọb͕ọ a nāchọ ihe-iriba-ama? n'ezie asim unu, Agaghi-enye ọb͕ọ a ihe-iriba-ama. 13O we rapu ha, ba kwa n'ub͕ọ ọzọ, we gabiga n'ofè ọzọ.
14Ha we chezọ iwere ob͕e achicha; ha enweghi kwa n'aka-ha nime ub͕ọ ihe kariri otù ob͕e achicha. 15O we gwasie ha ike, si, Nēlenu anya, lezienu anya ihe ndi-Farisi, bú ihe nēko achicha, na ihe Herod, bú ihe nēko achicha. 16Ha we nēkwurita n'etiti onwe-ha, si, Ọ bu n'ihi na ayi enweghi ob͕e achicha. 17Ebe Jisus mara ya Ọ si ha, Gini mere unu nēkwurita n'onwe-unu, n'ihi na unu enweghi ob͕e achicha? ùnu akātugharighi uche, ùnu akāghọtaghi kwa? èmere obi-unu etili? 18Unu ahughi uzọ mb͕e unu nwere anya? ùnu anughi kwa ihe mb͕e unu nwere nti? ùnu echetaghi kwa? 19Mb͕e M'nyawara ob͕e achicha ise nye nnù madu iri na nnù abua na ọgu iri, ǹkata ole juputara n'iberibe ka unu bulitere? Ha si Ya, Iri na abua. 20Mb͕e M'nyawara asa nye nnù madu iri, ìberibe juputara abọ ole ka unu tutukọrọ? Ha we si Ya, Asa. 21O we si ha, Ùnu akāghọtaghi?
22Ha we bía na Betsaida. Ha we kutara Ya onye-ìsì, riọ Ya ka O metu ya aka. 23O we jide onye-ìsì ahu n'aka, duputa ya n'obodo ntà ahu; mb͕e Ọ busara ya ọnu-miri n'anya, bikwasi kwa ya aka-Ya abua, O we jua ya, si, Ọ̀ di ihe i huru? 24O we le anya n'elu, si, Ahurum madu; n'ihi na ahurum ha dika osisi, ha nējeghari. 25Mb͕e ahu O bikwasiri aka-Ya abua n'anya-ya ọzọ; o we legide anya, eme kwa ka anya-ya di ka ha di na mbu, o we hucha ihe nile. 26O we zilaga ya n'ulo-ya, si, Abàla ọbuná n'obodo ntà nke à.
27Jisus we pua, Ya na ndi nēso uzọ-Ya, ba n'obodo ntà nile nke Sisaria Filipi: mb͕e ha nọ n'uzọ O we jua ndi nēso uzọ-Ya, si ha, Onye ka madu nāsi na Mu onwem bu? 28Ha we gwa Ya, si, Jọn Baptist: ndi ọzọ si kwa, Elaija; ma ndi ọzọ si, Otù nime ndi-amuma. 29Ya onwe-ya we jua ha, si, Ma ọ̀ bu onye ka unu onwe-unu si na Mu bu? Pita we za, si Ya, Gi onwe-gi bu Kraist ahu. 30O we dọ ha aka na nti ka ha ghara igwa onye ọ bula okwu bayere Ya. 31O we malite izí ha, na Nwa nke madu aghaghi ihu ọtutu ahuhu, na ndi-okenye na ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ aghaghi kwa iju Ya, na aghaghi ib͕u Ya, na Ọ ghaghi kwa isi n'ọnwu bilie mb͕e ubọchi atọ gasiri. 32Ọ nēkwuwa kwa, okwu ahu. Pita we kuru Ya nye n'aru, malite ibara Ya nba. 33Ma mb͕e O chighariri, hu ndi neso uzọ-Ya, Ọ bara Pita nba si, Ga n'azum, Setan: n'ihi na i dighi-atukwasi uche-gi n'ihe Chineke, kama ọ bu n'ihe madu. 34O we kpọ ìgwè madu ahu, ha na ndi nēso uzọ-Ya, ka ha biakute Ya, Ọ si ha, Ọ buru na onye ọ bula achọ ka o som n'azu, ya ju onwe-ya, buli kwa obe-ya, nēsokwam. 35N'ihi na onye ọ bula nke nāchọ izọputa ndu-ya, ọ gētufu ya; ma onye ọ bula nke gētufu ndu-ya n'ihim na n'ihi ozi ọma nkem, ọ gāzọputa ya. 36N'ihi na ùrù gini ka ọ bara madu, irita elu-uwa dum n'urù, ewe napu ya ndu-ya? 37N'ihi na ìhe-nb͕anwe gini ka madu gēji b͕anwe ndu-ya? 38N'ihi na onye ọ bula ihere Mu onwem na okwum nile gēme n'ọb͕ọ a nke nākwa iko, nke nēmehie kwa, ihere onye ahu gēme kwa Nwa nke madu, mb͕e Ọ gābia n'ebube nke Nna-Ya, Ya na ndi mọ-ozi-Ya di nsọ.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

MAK 8: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara