MAK 8:1-21
MAK 8:1-21 Bible Nso (IGBOB)
Na mb͕e ahu, mb͕e oké ìgwè madu di kwa ọzọ, mb͕e ha nēnweghi kwa ihe ha gēri, Ọ kpọrọ ndi nēso uzọ-Ya ka ha biakute Ya, si ha, Enwerem ọmiko n'aru ìgwè madu a, n'ihi na Mu na ha nọgidere ubọchi atọ ub͕u a, ha enweghi kwa ihe ha gēri: ọ buru kwa na ezilagam ha n'ulo-ha n'ọnu efu, ha gāda #mbà n'uzọ; ufọdu nime ha si kwa n'ebe di anya bia. Ndi nēso uzọ-Ya we za Ya, si, Ọle ebe ka madu gēsi pu inwe ob͕e achicha inyeju ndia afọ nime ọhia ebe a? O we jua ha, si, Ùnu nwere ob͕e achicha ole? Ha we si, Asa. O we gwa ìgwè madu ahu ka ha nọdu ala: O we nara ob͕e achicha asa ahu; mb͕e O kelesiri ekele, Ọ nyawa ha, we nēnye ndi nēso uzọ-Ya, ka ha debe n'iru ha; ha we debe ha n'iru ìgwè madu ahu. Ha nwe-kwa-ra azù ntà ole-na-ole: O we gọzie ha, si ka edebe kwa ndia n'iru ha. Ha we rie, afọ ju kwa ha: ha we tutukọ iberibe fọduru, abọ asa. Ma ndi ahu ra ka nnù iri: O we zilaga ha. Ngwa ngwa Ya na ndi nēso uzọ-Ya we ba n'ub͕ọ-ha, bia n'akuku Dalmanuta. Ndi-Farisi we puta, malite iju Ya ajuju, nāchọ ihe-iriba-ama n'aka-Ya site n'elu-igwe, n'inwa Ya. O we sua udè nke-uku na mọ-Ya, si, Gini mere ọb͕ọ a nāchọ ihe-iriba-ama? n'ezie asim unu, Agaghi-enye ọb͕ọ a ihe-iriba-ama. O we rapu ha, ba kwa n'ub͕ọ ọzọ, we gabiga n'ofè ọzọ. Ha we chezọ iwere ob͕e achicha; ha enweghi kwa n'aka-ha nime ub͕ọ ihe kariri otù ob͕e achicha. O we gwasie ha ike, si, Nēlenu anya, lezienu anya ihe ndi-Farisi, bú ihe nēko achicha, na ihe Herod, bú ihe nēko achicha. Ha we nēkwurita n'etiti onwe-ha, si, Ọ bu n'ihi na ayi enweghi ob͕e achicha. Ebe Jisus mara ya Ọ si ha, Gini mere unu nēkwurita n'onwe-unu, n'ihi na unu enweghi ob͕e achicha? ùnu akātugharighi uche, ùnu akāghọtaghi kwa? èmere obi-unu etili? Unu ahughi uzọ mb͕e unu nwere anya? ùnu anughi kwa ihe mb͕e unu nwere nti? ùnu echetaghi kwa? Mb͕e M'nyawara ob͕e achicha ise nye nnù madu iri na nnù abua na ọgu iri, ǹkata ole juputara n'iberibe ka unu bulitere? Ha si Ya, Iri na abua. Mb͕e M'nyawara asa nye nnù madu iri, ìberibe juputara abọ ole ka unu tutukọrọ? Ha we si Ya, Asa. O we si ha, Ùnu akāghọtaghi?
MAK 8:1-21 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼoge ahụ, igwe mmadụ ọzọ zukọrọ. Ebe ha na-enweghị ihe ha ga-eri, ọ kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Enwere m ọmịiko nʼebe igwe mmadụ ndị a nọ. Nke a na-eme ya ụbọchị atọ anyị na ha nọ. Ugbu a, ha enweghị ihe ha ga-eri. Ọ bụrụ na m ezilaga ha nʼụlọ ha, ụfọdụ nʼime ha ga-ada nʼụzọ nʼihi agụụ. Nʼihi na ụfọdụ ha si nʼebe dị anya bịa.” Ndị na-eso ụzọ ya zara ya, “Ebee ka mmadụ ga-achọta achịcha ga-ezuru ndị a nʼime ọzara a?” Jisọs jụrụ ha sị, “Ogbe achịcha ole ka unu nwere?” Ha zara sị, “Asaa.” Ọ gwara igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala. O weere ogbe achịcha asaa ahụ kpee ekpere. Ọ nyawasịrị ha, nye ha ndị na-eso ụzọ ya ka ha kee igwe mmadụ ahụ niile. Ha kekwara ya nye igwe mmadụ ahụ. Ha nwekwara azụ ole na ole. O weere ya kpee ekpere, ọ gwara ha ka ha kesaakwa ya. Ha riri, rijuo afọ. Ha tụtụkọtara iberibe achịcha dafuru nʼebe ndị a nọ rie nri. Ha tụtụjuru nkata asaa. Ndị riri nri a ruru ihe dịka puku mmadụ anọ. Mgbe ahụ o zilagara ha. Ngwangwa, ya na ndị na-eso ụzọ ya banyere nʼụgbọ mmiri gaa nʼakụkụ obodo Dalmanuta. Ndị Farisii bịakwutere ya malite nrụrịta ụka, na-achọ ihe ịrịbama si nʼeluigwe, iji nwalee ya. Ọ sụrụ ude nke ukwuu nʼime onwe ya sị, “Gịnị mere ọgbọ a ji achọ ihe ịrịbama? Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, o nweghị ihe ịrịbama a ga-egosi ọgbọ a.” Ọ hapụrụ ha nʼebe ahụ banyekwa nʼụgbọ mmiri ọzọ, ịgafe nʼofe ọzọ nke osimiri ahụ. Ndị na-eso ụzọ ya chefuru iwere achịcha. Ọ bụ naanị otu ogbe achịcha fọdụụrụ ha nʼime ụgbọ. Ọ dọrọ ha aka na ntị sị, “Kpacharanụ anya. Lepụnụ anya maka ihe na-eko achịcha ndị Farisii na nke Herọd.” Ha kparịtara ụka nʼetiti onwe ha na-asị, “Ọ bụ nʼihi na anyị enweghị achịcha.” Mgbe Jisọs ghọtara isi mkparịta ụka ha, ọ jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji na-ekwu okwu maka enweghị achịcha? Ọ pụtara na unu adịghị ahụ maọbụ aghọta? Obi unu o siri ike? Unu nwere anya nke na-adịghị ahụ ụzọ? Unu nwere ntị ma unu adịghị anụ ihe? Ọ ga-abụ na unu adịghị echeta? Mgbe m ji ogbe achịcha ise zụọ puku mmadụ ise, iberibe achịcha juru nkata ole ka unu tụtụkọtara?” Ha zara sị ya, “Nkata iri na abụọ.” “Mgbe m ji ogbe achịcha asaa zụọ puku mmadụ anọ, iberibe achịcha juru nkata ole ka unu tụtụkọtara?” Ha zara sị ya, “Nkata asaa.” Ọ sịrị ha, “Unu ka nọ na-enweghị nghọta?”