Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

MATIU 21:33-46

MATIU 21:33-46 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

“Ugbu a geekwanụ ntị nʼilu ọzọ. Otu onye dị nke nwere ala ubi. Ọ kụrụ osisi vaịnị nʼubi a. Ọ gbakwara ubi ya ogige, gwuokwa ebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị nʼime ya. O wukwara ụlọ elu nʼime ya. Mgbe o mesịrị ihe ndị a, o weere ubi ahụ tinye nʼaka ndị ga-elekọtara ya ubi ahụ, pụọ gaa nʼala ọzọ. Mgbe oge iwe ihe ubi ruru, o zipụrụ ndị odibo ya ka ha jekwuru ndị na-elekọta ubi ahụ, nata mkpụrụ nke ruuru ya site nʼubi ahụ. “Ma ndị na-elekọta ubi ahụ jidere ndị odibo ya ahụ tie otu onye nʼime ha ihe, gbukwaa onye ọzọ nʼime ha. Ha tụkwara otu nʼime ha nkume. Emesịa, o zigakwara ọtụtụ ndị odibo karịrị ndị nke mbụ nʼọnụọgụgụ. Ma ndị na-elekọta ubi ahụ mekwara ndị a ihe ha mere ndị nke mbụ. Nʼikpeazụ o zigara ọkpara ya, sị, ‘Ha ga-asọpụrụ nwa m.’ “Ma mgbe ndị na-elekọta ubi ahụ hụrụ ọkpara ya, ha gbara izu nʼetiti onwe ha sị, ‘Lee! Onye a bụ onye nketa ihe niile. Bịanụ ka anyị gbuo ya, ma nwetakwa ihe nketa ya.’ Ya mere, ha jidere ya nʼike, kpụrụ ya gafee nʼazụ ubi vaịnị ahụ, gbuo ya nʼebe ahụ. “Mgbe onye nwe ubi vaịnị ahụ lọtara, gịnị ka unu chere na ọ ga-eme ndị ahụ o tinyere ilekọtara ya ubi ya?” Ha zara ya sị, “Ọ ga-egbu ndị ajọ omume ahụ, laa ha nʼiyi nʼụzọ dị njọ. Ọ ga-ewerekwa ubi vaịnị ya tinye nʼaka ndị nlekọta ọzọ, ndị ga-enyekwa ya mkpụrụ ubi ruuru ya nʼoge ya.” Jisọs sịrị ha, “Ọ ga-abụ na unu agụtabeghị ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ sị, “ ‘Nkume ahụ ndị na-ewu ụlọ jụrụ, abụrụla nkume isi ntọala ụlọ. Nke a bụ ọrụ nke Onyenwe anyị rụrụ, ọ bụkwa ọrụ ịtụnanya nʼanya anyị.’ “Ya mere, ana m eme ka unu ghọta, na a ga-anapụ unu alaeze Chineke, were ya nye ndị mba ọzọ, ndị ga-amịpụta ezi mkpụrụ. Onye ọbụla nke dakwasịrị nʼelu nkume a ga-etiwasị, ma ọ ga-egwepịa onye ọbụla nke ọ dakwasịrị.” Mgbe ndịisi nchụaja na ndị Farisii nụrụ ilu ya ndị a, ha ghọtara na ọ na-ekwu banyere ha. Ha chọrọ ụzọ ha ga-esi jide ya, ma oke egwu igwe mmadụ ahụ tụrụ ha, nʼihi na ha gụrụ ya nʼonye amụma.

MATIU 21:33-46 Bible Nso (IGBOB)

Nurunu ilu ọzọ: Otù nwoke di, bú nna-nwe-ulo, onye kuru ubi-vine, b͕a ya ogige buruburu, gwu kwa ebe-nzọcha-nkpuru-vine nime ya, wu kwa ulo-elu, were kwa ya tiyere n'aka ndi-ọlu-ubi, we je ala ọzọ. Ma mb͕e oge nkpuru ruru nso, o zigara ndi-orù-ya jekuru ndi-ọlu-ubi ahu, inata nkpuru-ya. Ndi-ọlu-ubi ahu we jide ndi-orù-ya, pia otù onye ihe, b͕u kwa nke-ọzọ, tu kwa nke-ọzọ nkume. Ọzọ, o zigara ndi-orù ọzọ di ọtutu kari ndi mbu: ha we me kwa ha otú ahu. Ma emesia o zigara ha ọkpara-ya, si, Ha gāsọpuru ọkparam. Ma ndi-ọlu-ubi ahu, mb͕e ha huru ọkpara ahu, ha sirita onwe-ha, Nka bu onye-nketa; bianu, ka ayi b͕ue ya, nwere kwa ihe-nketa-ya. Ha we jide ya, tupu ya n'azu ubi-vine ahu, b͕ue ya. Ya mere, mb͕e ọ bula onye-nwe ubi-vine ahu gābia, gini ka ọ gēme ndi-ọlu-ubi ahu? Ha si ya, Ọ gāla ndi ọjọ ahu n'iyì n'uzọ jọrọ njọ, ọ gēwere kwa ubi-vine-ya tiye n'aka ndi-ọlu-ubi ọzọ, ndi gēnyeghachi ya nkpuru-ya n'oge-ha. Jisus si ha, Ọ̀ dighi mb͕e ọ bula unu guru n'ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, Nkume nke ndi nēwu ulo juru, Nke ahu ka emere isi nkuku ulo: Ọ bu n'aka Onye-nwe-ayi ka nka sitere, Ọ bu kwa oké ọlu n'anya-ayi? N'ihi nka ka M'ji si unu, Agānara unu ala-eze Chineke, we nye mba ọzọ nke nāmi nkpuru-ya. Agētiwasi kwa onye dakwasiri nkume a: ma onye ọ bula ọ gādakwasi, ọ gēfesa ya dika ájá. Mb͕e ndi-isi-nchu-aja na ndi-Farisi nuru ilu-Ya nile, ha we mara na Ọ nēkwu okwu bayere ha. Mb͕e ha nāchọ ijide Ya, ha we tua egwu ìgwè madu nile, ebe ha guru Ya n'onye-amuma.