Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

MATIU 21

21
1Ma mb͕e ha biaruru Jerusalem nso, bia kwa na Betfagi, rue ugwu Olive, mb͕e ahu Jisus zigara madu abua nēso uzọ-Ya, 2si ha, Ganu n'obodo ntà nke di na ncherita-iru unu, ngwa ngwa unu gāhu inyinya-ibu elibeworo, ya na nwa-inyinya-ibu: tọpunu ha, sekputaram ha. 3Ọ buru kwa na onye ọ bula si unu ihe ọ bula, unu gāsi, Ha di Onye-nwe-ayi nkpà; ngwa ngwa ọ gēzite ha. 4Ma emewo nka, ka okwu ekwuru site n'ọnu onye-amuma we mezu, si,
5Sinu ada Zaion,
Le, Eze-gi nābiakute gi,
Ọ di nwayọ, Ọ nānọkwasi kwa n'inyinya-ibu,
Na n'elu nwa-inyinya-ibu, bú nwa anu nēbu ibu.
6Ndi ahu ndi nēso uzọ-Ya we ga, me dika Jisus nyere ha iwu, 7ha we sekputa inyinya-ibu ahu, na nwa-inyinya-ibu ahu, wukwasi ha uwe-ha; O we nọkwasi ha. 8Ndi kariri n'ìgwè madu ahu we tusa uwe-ha n'uzọ; ndi ọzọ b͕ubitara alaka n'osisi, tusa kwa ha n'uzọ. 9Ìgwè madu nile ndi nāga n'iru Ya, ndi nēso kwa, nēti nkpu, si, Hosanna diri Nwa Devid: Onye agọziri agọzi ka Onye ahu bu Nke nābia n'aha Onye-nwe-ayi; Hosanna n'ebe kachasi ihe nile elu. 10Mb͕e Ọ batara na Jerusalem, obodo ahu nile we ma jijiji, si, Ònye bu Nwoke a? 11Ìgwè madu ahu we nāsi, Nwoke a bu Onye-amuma ahu, Jisus, Nke si na Nazaret nke Galili bia.
12Jisus we ba n'ulo uku Chineke, chupu ndi nile nēre nāzu kwa n'ulo uku Chineke, O we kpùe table nile nke ndi nāb͕anwe ego iru, na oche nile nke ndi nēre nduru; 13Ọ si ha, Edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Agākpọ ulom ulo ekpere: ma unu onwe-unu nēme ya ọb͕à ndi nāpunara madu ihe. 14Ndi-ìsi na ndi-ngwurọ we biakute Ya n'ulo uku Chineke: O we me ka aru-ha di ike. 15Ma mb͕e ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ huru ọlu-ebube nile Ọ luru, na umuaka ndi nēti nkpu n'ulo uku Chineke, si, Hosanna diri Nwa Devid; iwe were ha nke-uku, 16ha si Ya, Ì nānu okwu umuntakiri ndia nēkwu? Jisus we si ha, E: Ọ̀ dighi mb͕e ọ bula unu guru, I si n'ọnu umu ọhu na umu nāṅu ara me ka ọjija zue okè? 17O we rapu ha, si n'obodo ahu pua je Betani, nọ ọnọdu-abali n'ebe ahu.
18Ma n'ututu mb͕e Ọ nālaghachi n'obodo ahu, agu guru Ya. 19Mb͕e Ọ huru otù osisi fig n'uzọ, Ọ biarue ya aru, ma Ọ hughi ihe ọ bula n'elu ya, ma-ọbughi nání akwukwọ ndu; O we si ya, Ka nkpuru ghara iputa n'elu gi ọzọ ebighi-ebi. Osisi fig ahu we kpọnwua n'otù mb͕e ahu. 20Mb͕e ndi nēso uzọ-Ya huru ya, o ju ha anya, ha si, Òsisi fig ahu si aṅa kpọnwua n'otù mb͕e a? 21Jisus we za, si ha, N'ezie asim unu, Ọ buru na unu nwere okwukwe, ghara inwe obi abua, ọ bughi nání ihe emere osisi fig nka ka unu gēme, ma ọ buru na unu gāsi ọbuná ugwu a, Ka ewelie gi, tubà gi nime oké osimiri, agēme ihe ahu. 22Ihe nile, ka ha ra, bú nke unu gāriọ n'ekpere, ma asi na unu kwere, unu gānata kwa ha.
23Mb͕e Ọ batara n'ulo uku Chineke, ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye nke ndi-Ju we biakute Ya mb͕e O nēzí ihe, si, Ọ̀ bu n'aha ike gini ka I nēme ihe ndia? ònye nye-kwa-ra Gi ike a? 24Ma Jisus zara, si ha, Mu onwem gāju kwa unu otù okwu, ọ buru na unu agwam ya, Mu onwem gāgwa kwa unu aha ike M'ji eme ihe ndia. 25Baptism nke Jọn, òle ebe o si puta? ò sitere n'elu-igwe, ma-ọbu na o sitere n'aka madu? Ha we kwurita n'etiti onwe-ha, si, Ọ buru na ayi asi, O sitere n'elu-igwe; Ọ gāsi ayi, N'ìhi gini kwa ka unu nējighi kwe ya? 26Ma ọ buru na ayi asi, O sitere n'aka madu; ayi nātu egwu ìgwè madu a; n'ihi na madu nile nāgu Jọn dika onye-amuma. 27Ha we za Jisus, si, Ayi amataghi. Ọ si-kwa-ra ha, Mu onwem agaghi-agwa kwa unu aha ike M'ji eme ihe ndia. 28Ma gini bu uche-unu? Otù nwoke nwere umu abua; o we biakute nke-mbu, si, Nwa, je lua ọlu ta n'ubi-vine nkem. 29Ma ọ zara, si, Achọghm ije: ma emesia ọ kwa uta, we je. 30O we biakute nke-abua, kwue otú ahu. O we za, si, Mu onwem gēje, Onye-nwe-ayi: ma o jeghi. 31Ònye nime ha abua mere ihe nna-ya chọrọ? Ha si, Onye mbu. Jisus si ha, N'ezie asim unu, na ndi-ọna-utu na ndinyom nke nākwa iko nēbu unu uzọ abà n'ala-eze Chineke. 32N'ihi na Jọn biakutere unu n'uzọ ezi omume, ma unu ekweghi ya: ma ndi-ọna-utu na ndinyom nke nākwa iko kwere ya: ma mb͕e unu huru ya, unu onwe-unu akwaghi uta ọbuná emesia, ka unu we kwere ya.
33Nurunu ilu ọzọ: Otù nwoke di, bú nna-nwe-ulo, onye kuru ubi-vine, b͕a ya ogige buruburu, gwu kwa ebe-nzọcha-nkpuru-vine nime ya, wu kwa ulo-elu, were kwa ya tiyere n'aka ndi-ọlu-ubi, we je ala ọzọ. 34Ma mb͕e oge nkpuru ruru nso, o zigara ndi-orù-ya jekuru ndi-ọlu-ubi ahu, inata nkpuru-ya. 35Ndi-ọlu-ubi ahu we jide ndi-orù-ya, pia otù onye ihe, b͕u kwa nke-ọzọ, tu kwa nke-ọzọ nkume. 36Ọzọ, o zigara ndi-orù ọzọ di ọtutu kari ndi mbu: ha we me kwa ha otú ahu. 37Ma emesia o zigara ha ọkpara-ya, si, Ha gāsọpuru ọkparam. 38Ma ndi-ọlu-ubi ahu, mb͕e ha huru ọkpara ahu, ha sirita onwe-ha, Nka bu onye-nketa; bianu, ka ayi b͕ue ya, nwere kwa ihe-nketa-ya. 39Ha we jide ya, tupu ya n'azu ubi-vine ahu, b͕ue ya. 40Ya mere, mb͕e ọ bula onye-nwe ubi-vine ahu gābia, gini ka ọ gēme ndi-ọlu-ubi ahu? 41Ha si ya, Ọ gāla ndi ọjọ ahu n'iyì n'uzọ jọrọ njọ, ọ gēwere kwa ubi-vine-ya tiye n'aka ndi-ọlu-ubi ọzọ, ndi gēnyeghachi ya nkpuru-ya n'oge-ha. 42Jisus si ha, Ọ̀ dighi mb͕e ọ bula unu guru n'ihe edeworo n'akwukwọ nsọ,
Nkume nke ndi nēwu ulo juru,
Nke ahu ka emere isi nkuku ulo:
Ọ bu n'aka Onye-nwe-ayi ka nka sitere,
Ọ bu kwa oké ọlu n'anya-ayi?
43N'ihi nka ka M'ji si unu, Agānara unu ala-eze Chineke, we nye mba ọzọ nke nāmi nkpuru-ya. 44Agētiwasi kwa onye dakwasiri nkume a: ma onye ọ bula ọ gādakwasi, ọ gēfesa ya dika ájá. 45Mb͕e ndi-isi-nchu-aja na ndi-Farisi nuru ilu-Ya nile, ha we mara na Ọ nēkwu okwu bayere ha. 46Mb͕e ha nāchọ ijide Ya, ha we tua egwu ìgwè madu nile, ebe ha guru Ya n'onye-amuma.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

MATIU 21: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara