Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

MATIU 15:21-39

MATIU 15:21-39 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Jisọs hapụrụ obodo ahụ gaa nʼakụkụ obodo Taịa na Saịdọn. Nʼebe ahụ, otu nwanyị onye Kenan bi nʼobodo ahụ bịakwutere ya rịọọ ya sị, “Onyenwe m, nwa Devid, biko meere m ebere. Ada m nwanyị nwere ajọ mmụọ nʼime ya nke na-esogbu ya oge niile.” Ma ọ gbara ya nkịtị. Emesịa ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya rịọ ya sị ya, “Chụlaa nwanyị a! Lee ka o si eti mkpu na-esogharị anyị!” Ọ zara sị, “Ezitere m naanị ijekwuru atụrụ furu efu nke ụlọ Izrel.” Ma ọ bịara daa nʼụkwụ ya rịọọ ya sị, “Onyenwe m, nyere m aka!” Ọ zara sị, “O zighị ezi na a ga-ewere nri ụmụntakịrị tụpụrụ nkịta.” Ọ zara sị, “Ọ bụ eziokwu Onyenwe m. Ma a na-ekwekwa ka ụmụ nkịta nọ nʼokpuru tebul rie iberibe nri nke na-esi nʼelu tebul ha daa nʼala.” Jisọs zara sị ya, “Nwanyị, okwukwe gị dị ukwuu! Laa, e meelara gị ihe ị na-arịọ.” Nʼotu oge ahụ a gwọrọ ada ya. Jisọs hapụrụ ebe ahụ lọghachi nʼakụkụ osimiri Galili. Ọ rịgooro nʼelu ugwu nọdụ ala. Igwe mmadụ dị ukwuu bịakwutere ya. Ha duteere ya ndị ngwụrọ, na ndị ìsì, na ndị aka ha na ndị ụkwụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ, na ndị ogbi, na ọtụtụ ndị ọzọ. Ha tọgbọrọ ha nʼụkwụ ya, ọ gwọkwara ha niile. Ọ tụrụ mmadụ niile nʼanya mgbe ha hụrụ ndị ogbi ka ha bidoro ikwu okwu. Mgbe ha hụkwara na a gwọrọ ndị aka ha, na ndị ụkwụ ha nwụrụ anwụ, o jukwara ha anya ịhụ na ndị ngwụrọ gara ije, na ndị ìsì hụkwara ụzọ. Ha toro Chineke nke Izrel. Jisọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Ana m emere igwe mmadụ ndị a obi ebere, nʼihi na mụ na ha anọọla ụbọchị atọ nʼebe a, ma ha eribeghị nri ọbụla. Agaghị m ezilaga ha na-erighị nri, nʼihi na ha nwere ike ịda nʼụzọ.” Ndị na-eso ụzọ ya sịrị, “Ebee ka anyị ga-enweta nri ga-ezuru igwe mmadụ ndị a nʼọzara a?” Jisọs jụrụ ha sị, “Ogbe achịcha ole ka unu nwere?” Ha sịrị ya, “Ogbe achịcha asaa na azụ ole na ole.” Ọ gwara igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala. O weere ogbe achịcha asaa na azụ ole na ole ahụ kelee Chineke ekele. Ọ nyawasịrị ha, nye ndị na-eso ụzọ ya. Ndị na-eso ụzọ ya nyekwara igwe mmadụ ahụ. Onye ọbụla nʼime ha riri, rijuo afọ. Ndị na-eso ụzọ ya tụtụkọtara iberibe ndị fọdụrụ nke juru nkata asaa. Ndị riri nri ahụ dị puku ụmụ nwoke anọ, nʼagụnyeghị ndị nwanyị na ụmụntakịrị. Mgbe o zilagara igwe mmadụ ahụ, ọ banyere nʼụgbọ mmiri gafee osimiri, bịaruo nʼobodo Magadan.

MATIU 15:21-39 Bible Nso (IGBOB)

Jisus we si n'ebe ahu pua, wezuga Onwe-ya ga n'akuku Taia na Saidon. Ma le, otù nwanyi Kenean siri n'ókè-ala ahu puta, tie nkpu, si, Merem ebere, Onye-nwe-ayi, Nwa Devid; mọ ọjọ nējisi nwam nwanyi ike. Ma Ọ zaghi ya okwu ọ bula. Ndi nēso uzọ-Ya we biakute Ya, nēkpere Ya, si, Zilaga ya; n'ihi na ọ nētiso ayi nkpu. Ma Ọ zara, si, Eziteghm ma-ọbughi ijekuru aturu furu efu nke ulo Israel. Ma nwanyi ahu biara nākpọ isi ala nye Ya, si, Onye-nwe-ayi, yerem aka. Ma Ọ zara, si, Ọ dighi nma inara nri umu tupuru umu-nkita. Ma ọ siri, E, Onye-nwe-ayi: n'ihi na ọbuná umu-nkita nēri ufọdu nime irighiri nke nādaputa na table nke ndi-nwe-ha. Mb͕e ahu Jisus zara, si ya, Nwayi, okwukwe-gi di uku: ka emere gi dika i nāchọ. Ewe me ka aru di nwa-ya nwanyi ike site n'oge hour ahu. Jisus we si n'ebe ahu pua bia n'usọ osimiri Galili; O we rigo n'ugwu ahu, we nọdu n'ebe ahu. Ọtutu ìgwè madu we biakute Ya, chiri ndi-ngwurọ, ndi-ìsì, ndi-ob͕i, ndi-ọlusi, na ọtutu ndi-ọria di iche, tiyere onwe-ha, ha we tọb͕ọ ha n'ala n'ukwu-Ya; O we me ka aru-ha di ike: ya mere na o juru ìgwè madu ahu anya, mb͕e ha huru ndi-ob͕i ka ha nēkwu okwu, na ndi-ọlusi ka aru-ha di nma, na ndi-ngwurọ ka ha nēje ije, na ndi-ìsì ka ha nāhu uzọ: ha we to Chineke nke Israel. Jisus we kpọ ndi nēso uzọ-Ya ka ha biakute Ya, Ọ si, Enwerem ọmiko n'aru ìgwè madu a, n'ihi na Mu na ha nọgidere ubọchi atọ ub͕u a, ha enweghi kwa ihe ha gēri: ma achọghm izilaga ha n'ọnu efu, ka ha ghara ida #mbà n'uzọ ma eleghi anya. Ndi nēso uzọ-Ya we si Ya, Òle ebe ka ayi gēsi nwe ọtutu ob͕e achicha ra otú a n'ọhia, inyeju oké ìgwè madu di otú a afọ? Jisus we si ha, Ùnu nwere ob͕e achicha ole? Ha we si, Asa, na azù ntà ole-na-ole. O we gwa ìgwè madu ahu ka ha nọdu ala; O we nara ob͕e achicha asa ahu na azù ahu; mb͕e O kelesiri ekele, Ọ nyawa ha, we nēnye ndi nēso uzọ-Ya, ndi nēso uzọ-Ya nēnye kwa ìgwè madu nile. Ha nile we rie, afọ ju kwa ha: ha we tutukọ nke fọduru nime iberibe ahu, abọ asa juru. Ma ndi riri bu nnù ndikom iri, nāgughi ndinyom na umuaka. Mb͕e O zilagasiri ìgwè madu nile, Ọ ba n'ub͕ọ ahu, bia n'ókè-ala Magadan.