MATIU 14:13-20
MATIU 14:13-20 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe Jisọs nụrụ akụkọ a, ọ banyere nʼụgbọ mmiri gaa nʼọzara, ebe ọ ga-anọdụrụ onwe ya. Ma mgbe igwe mmadụ nụrụ ya, ha si obodo dị iche iche sooro ya nʼukwu ala. Mgbe o sitere nʼụgbọ mmiri ahụ rịdata, ọ hụrụ oke igwe mmadụ. O nwere ọmịiko nʼebe ha nọ, gwọọ ndị ọrịa nʼetiti ha. Nʼoge anyasị ụbọchị ahụ, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya sị ya, “Chi na-achọ iji. Ebe a abụkwaghị ebe ndị mmadụ bi. O nweghị nri a ga-azụta nʼọzara a. Zilaga igwe mmadụ ndị a ka ha gaa nʼime obodo zụọra onwe ha nri.” Ma Jisọs gwara ha sị, “Ọ dịghị mkpa na ha ga-ala. Nyenụ ha nri ka ha rie.” Ha zara ya sị, “Ọ bụ naanị ogbe achịcha ise na azụ abụọ ka anyị nwere.” Ọ sịrị ha, “Wetaranụ m ha nʼebe a.” Ọ gwara igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala nʼahịhịa. O weere ogbe achịcha ise na azụ abụọ ahụ welie anya ya elu nye Chineke ekele. Ọ nyawara achịcha ahụ, nye ha ndị na-eso ụzọ ya, ndị na-eso ụzọ ya nyere ha igwe mmadụ ahụ. Onye ọbụla riri rijuo afọ. Emesịa, ndị na-eso ụzọ Jisọs tụtụkọtara iberibe achịcha dara nʼala tụtụjuo ha nkata iri na abụọ.
MATIU 14:13-20 Bible Nso (IGBOB)
Ma mb͕e Jisus nuru ya, O si n'ebe ahu wezuga Onwe-ya n'ub͕ọ, je iche rue ebe bu ọhia: mb͕e ìgwè madu nile nuru ya, ha we si n'obodo ahu nile so Ya n'ukwu ala. O we puta, hu oké ìgwè madu, O we nwe ọmiko n'aru ha, me ndi-nriaria-ha ka aru-ha di ike. Ma mb͕e o ruru anyasi, ndi nēso uzọ-Ya biakutere Ya, si, Ebe a bu ọhia, oge agawo kwa ub͕u a; zilaga ìgwè madu ndia, ka ha we je n'obodo ntà nile buruburu, zuru onwe-ha ihe-oriri. Ma Jisus siri ha, Ọ dighi ha nkpà ka ha la; unu onwe-unu nye ha ihe ka ha rie. Ha we si Ya, Ayi enweghi n'ebe a ma-ọbughi ob͕e achicha ise na azù abua. O we si, Chita ha n'ebe a nyem. O we gwa ìgwè madu nile ka ha nọdu n'elu ahihia; O we nara ob͕e achicha ise na azù abua ahu, le anya n'elu-igwe, gọzie ha, nyawaha, we nēnye ndi nēso uzọ-Ya ob͕e achicha ahu, ndi nēso uzọ-Ya nēnye kwa ìgwè madu nile. Ha nile we rie, afọ ju-kwa-ra ha: ha we tutukọ nke fọduru nime iberibe ahu, nkata iri na abua juru.