Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

LUK 13:22-35

LUK 13:22-35 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

O jegharịrị nʼobodo ukwu na nʼobodo nta niile na-ezi ihe, ka ọ na-aga Jerusalem. Otu onye sịrị ya, “Onyenwe m, ndị a ga-azọpụta ha ga-adị ole na ole?” Ọ sịrị ha, “Gbalịsienụ ike banye site nʼọnụ ụzọ dị warawara, nʼihi na ana m a gwa unu na ọtụtụ ga-achọ ịbanye ma ha agaghị enwe ike. Ọ bụrụ na nna nwe ụlọ ebilie mechie ọnụ ụzọ, unu ga-eguzo na-ezi na-akụ aka nʼụzọ na-asị, ‘Onyenwe anyị meghere anyị ụzọ.’ “Na nzaghachi, ọ ga-asị, ‘Amaghị m ebe unu si bịa.’ “Nʼoge ahụ, unu ga-asị, ‘Anyị na gị rikọrọ, ṅụkọkwaa, ị kuzikwara nkuzi nʼogbe anyị.’ “Ma ọ ga-asị, ‘Amaghị m ebe unu siri bịa. Pụọnụ nʼihu m, unu ndị ajọ omume.’ “Ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adịkwa mgbe unu ga-ahụ Ebraham, na Aịzik na Jekọb na ndị amụma niile ka ha nọ nʼalaeze Chineke; ma unu onwe unu abụrụ ndị a chụpụrụ nʼezi. Ndị mmadụ ga-esite nʼọwụwa anyanwụ, nakwa ọdịda anyanwụ, na nʼugwu na ndịda nke ụwa bịa nọdụ nʼoriri nʼime alaeze Chineke. Ma lee, ndị bu ụzọ ga-aghọ ndị ikpeazụ, ma ndị ikpeazụ ga-aghọ ndị bu ụzọ.” Nʼoge awa ahụ, ụfọdụ ndị Farisii bịakwutere ya sị ya, “Si nʼebe a pụọ, nʼihi na Herọd na-achọ igbu gị.” Ọ sịrị ha, “Gaa gwaranụ m nkịta ọhịa ahụ, lee, ana m achụpụ mmụọ ọjọọ, gwọọkwa ndị ọrịa taa na echi, ma nʼụbọchị nke atọ ka m ga-arụcha ọrụ m. Ma otu ọ dị, aga m aga nʼihu nʼụzọ m taa, na echi na nwanne echi, nʼihi na nʼezie, ọ dịghị onye amụma ga-anwụ nʼebe ọzọ na-abụghị na Jerusalem. “O Jerusalem! Jerusalem! Gị onye na-egbu ndị amụma ma na-ejikwa nkume atụgbu ndị e ziteere gị. Ọtụtụ mgbe ka m gbalịrị ịchịkọta ụmụ gị dị ka nne ọkụkụ sị achịkọta ụmụ ya nʼokpuru nku ya, ma unu ekweghị. Lee, a hapụrụla unu ụlọ unu. Ma agwa m unu, unu agaghị ahụ m anya ọzọ ruo mgbe oge ahụ ga-abịa, mgbe unu ga-asị, ‘Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị.’   ”

LUK 13:22-35 Bible Nso (IGBOB)

O we nāga n'obodo na obodo ntà di iche iche, nēzí ihe, nāga kwa ije-Ya iru Jerusalem. Otù onye we si Ya, Onye-nwe-ayi, Ǹdi anāzọputa di madu ole-na-ole? O we si ha, Jisienu ike isi n'ọnu-uzọ di warara ba: n'ihi na ọtutu madu, ka M'si unu, gāchọ ibà nime ya, ma ha agaghi-enwe ike. Mb͕e Nna-nwe-ulo gēbiliwori, mechi kwa uzọ-Ya, unu we malite iguzo n'èzí, na iku aka n'ọnu-uzọ ahu, si Onye-nwe-ayi, meghere ayi uzọ; ma Ọ gāza, si unu, Amataghim unu, ebe unu si bia; mb͕e ahu ka unu gāmalite isi, Ayi riri ihe ṅu kwa ihe-ọṅuṅu n'iru Gi, I zíkwara ihe n'amá-ayi; ma Ọ gāsi, Asim unu, amataghm ebe unu si bia; puanu n'irum, ndi nile nālu ọlu ajọ omume. N'ebe ahu ka ikwa-ákwá na ita ikekere-ezé ahu gādi, mb͕e unu gāhu Abraham, na Aisak, na Jekob, na ndi-amuma nile, n'ala-eze Chineke, ma unu onwe-unu aburu ndi achupuru n'èzí. Ha gēsi kwa n'Ọwuwa-anyanwu na Ọdida-anyanwu, si kwa n'Ugwu na Ndida, bia, nọdu kwa n'ala-eze Chineke. Ma le, ndi-ikpe-azu di ndi gēbu uzọ, ndi bu uzọ di kwa ndi gābu ndi-ikpe-azu. N'oge hour ahu ndi-Farisi ufọdu biakutere Ya, si Ya, Pua, si n'ebe a la: n'ihi na Herod nāchọ ib͕u Gi. O we si ha, Ganu, si nkita-ọhia ahu, Le, anamachupu ndi-mọ ọjọ, nāluzu kwa ọlu ime ka aru di madu ike ta na echi, n'ubọchi nke-atọ emekwam ka M'zu okè. Otú ọ di, aghaghi m iga ta na echi na ubọchi so ya: n'ihi na apughi ikwe ka onye-amuma la n'iyì n'ebe nābughi Jerusalem. Jerusalem, Jerusalem, nke nēb͕u ndi-amuma, nke nēwere kwa nkume atu ndi eziteworo ya! ọ̀tutu mb͕e ole ka M'chọrọ ichikọ umu-gi, ọbuná dika nnekwu-ọkuku nāchikọ umu nke aka ya n'okpuru nkù-ya abua, ma unu achọghi! Le, anārapuru unu ulo-unu: ma asim unu, Unu agaghi-ahum ma-ọli, rue mb͕e unu gāsi, Onye agọziri agọzi ka Onye ahu bu Nke nābia n'aha Onye-nwe-ayi.