Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Luk 13:22-35

Luk 13:22-35 BIU

O jegharịrị nʼobodo ukwu na nʼobodo nta niile na-ezi ihe, ka ọ na-aga Jerusalem. Otu onye sịrị ya, “Onyenwe m, ndị a ga-azọpụta ha ga-adị ole na ole?” Ọ sịrị ha, “Gbalịsienụ ike banye site nʼọnụ ụzọ dị warawara, nʼihi na ana m a gwa unu na ọtụtụ ga-achọ ịbanye ma ha agaghị enwe ike. Ọ bụrụ na nna nwe ụlọ ebilie mechie ọnụ ụzọ, unu ga-eguzo na-ezi na-akụ aka nʼụzọ na-asị, ‘Onyenwe anyị meghere anyị ụzọ.’ “Na nzaghachi, ọ ga-asị, ‘Amaghị m ebe unu si bịa.’ “Nʼoge ahụ, unu ga-asị, ‘Anyị na gị rikọrọ, ṅụkọkwaa, ị kuzikwara nkuzi nʼogbe anyị.’ “Ma ọ ga-asị, ‘Amaghị m ebe unu siri bịa. Pụọnụ nʼihu m, unu ndị ajọ omume.’ “Ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adịkwa mgbe unu ga-ahụ Ebraham, na Aịzik na Jekọb na ndị amụma niile ka ha nọ nʼalaeze Chineke; ma unu onwe unu abụrụ ndị a chụpụrụ nʼezi. Ndị mmadụ ga-esite nʼọwụwa anyanwụ, nakwa ọdịda anyanwụ, na nʼugwu na ndịda nke ụwa bịa nọdụ nʼoriri nʼime alaeze Chineke. Ma lee, ndị bu ụzọ ga-aghọ ndị ikpeazụ, ma ndị ikpeazụ ga-aghọ ndị bu ụzọ.” Nʼoge awa ahụ, ụfọdụ ndị Farisii bịakwutere ya sị ya, “Si nʼebe a pụọ, nʼihi na Herọd na-achọ igbu gị.” Ọ sịrị ha, “Gaa gwaranụ m nkịta ọhịa ahụ, lee, ana m achụpụ mmụọ ọjọọ, gwọọkwa ndị ọrịa taa na echi, ma nʼụbọchị nke atọ ka m ga-arụcha ọrụ m. Ma otu ọ dị, aga m aga nʼihu nʼụzọ m taa, na echi na nwanne echi, nʼihi na nʼezie, ọ dịghị onye amụma ga-anwụ nʼebe ọzọ na-abụghị na Jerusalem. “O Jerusalem! Jerusalem! Gị onye na-egbu ndị amụma ma na-ejikwa nkume atụgbu ndị e ziteere gị. Ọtụtụ mgbe ka m gbalịrị ịchịkọta ụmụ gị dị ka nne ọkụkụ sị achịkọta ụmụ ya nʼokpuru nku ya, ma unu ekweghị. Lee, a hapụrụla unu ụlọ unu. Ma agwa m unu, unu agaghị ahụ m anya ọzọ ruo mgbe oge ahụ ga-abịa, mgbe unu ga-asị, ‘Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị.’   ”