Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

LEVITIKỌS 27:14-34

LEVITIKỌS 27:14-34 Bible Nso (IGBOB)

Ọzọ, mb͕e onye ọ bula gēdo ulo-ya nsọ idiri Jehova nsọ, onye-nchu-àjà gārù kwa ya ọnu, ma ọ bu ezi ulo ma-ọbu ulo ọjọ: dika onye-nchu-àjà gārù ya ọnu, otú a ka o gēguzo. Ọ buru kwa na onye ahu nke nēdo ya nsọ ab͕aputa ulo-ya, ọ gātukwasi kwa otù uzọ n'uzọ ise nke ego ọ̀rùrù-ọnu-gi, ọ gābu kwa nke ya. Ma ọ buru na onye ọ bula ewere ufọdu nime ala-ubi nke ihe-onwunwe-ya doro Jehova nsọ, ọ̀rùrù-ọnu-gi gādi kwa ka nkpuru-ọghigha-ya si di; otù homer nke nkpuru-ọghigha ọka barley, agārù ọnu-ya n'ọgu shekel ọla-ọcha abua na iri. Ọ buru na o sitere n'arọ jubile do ala-ubi-ya nsọ, dika ọ̀rùrù-ọnu-gi si di ka o gēguzo. Ma ọ buru na o do ala-ubi-ya nsọ mb͕e jubile gasiri, onye-nchu-àjà gāgu-kwa-ra ya ego-ya dika arọ fọduru iru arọ jubile si di, agāgubì kwa ihe n'ọ̀rùrù-ọnu-gi. Ma ọ buru na onye ahu nke nēdo ala-ubi nsọ ab͕aputa ya n'ezie, ọ gātukwasi kwa ya otù uzọ n'uzọ ise nke ego ọ̀rùrù-ọnu-gi, agēme kwa ka o guzosiere ya ike. Ma ọ buru na ọ b͕aputaghi ala-ubi ahu, ma-ọbu na ọ renyewo onye ọzọ ala-ubi ahu, agaghi-ab͕aputa ya ọzọ: ma ala-ubi ahu, n'òpùpù-ya nime jubile, gādiri Jehova nsọ, dika ala-ubi nke ewezugara ka ebibie ya; onye-nchu-àjà gēnwe ihe-onwunwe ala-ubi ahu. Ma ọ buru na o doro Jehova ala-ubi ọ zuworo nsọ, bú nke nēsiteghi n'ala-ubi nke ihe-onwunwe-ya; onye-nchu-àjà gāgu-kwa-ra ya ọgugu nke ọ̀rùrù-ọnu-gi rue arọ jubile: ọ gēnye kwa ọ̀rùrù-ọnu-gi n'ubọchi ahu, dika ihe nsọ diri Jehova. N'arọ jubile ala-ubi ahu gālaghachiri onye azutara ya n'aka-ya, bú onye nwe ihe-onwunwe nke ala ahu. Ọ̀rùrù-ọnu-gi nile gādi kwa ka shekel nke ebe nsọ si di: orú gerah gābu shekel ahu. Nání nwa eburu uzọ mu n'etiti anu-ulo, nke anēme ka ọ buru nwa eburu uzọ muru Jehova, ọ dighi onye ọ bula gēdo ya nsọ: ma ọ bu ehi ma-ọbu aturu, ihe Jehova nwere ka ọ bu. Ma ọ buru na ọ di n'etiti anu-ulo ruru árú, ọ gāb͕aputa kwa ya dika ọ̀rùrù-ọnu-gi si di, ọ gātukwasi kwa ya otù uzọ n'uzo ise ya: ma ọ buru na ab͕aputaghi ya, agēre kwa ya dika ọ̀rùrù-ọnu-gi si di. Nání, ọ dighi ihe ọ bula agēre ma-ọbu b͕aputa, nke ewezugara ka ebibie ya, nke onye ọ bula gēwezugara Jehova ka ebibie ya, site n'ihe nile o nwere, site na madu na anu-ulo, ma-ọbu site n'ala-ubi nke ihe-onwunwe-ya: ihe ọ bula ewezugara ka ebibie ya, ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ buru Jehova. Ọ dighi onye ọ bula agāb͕aputa, nke ewezugara ka ebibie ya, nke agēwezuga ka ebibie ya site n'etiti madu: aghaghi ime ka ọ nwua. Otù uzọ n'uzọ iri ihe nile nke ala, site na nkpuru-ọghigha nke ala, ma ọbu site na nkpuru osisi, ihe Jehova nwere ka ọ bu: ọ bu ihe nsọ diri Jehova. Ma ọ buru na onye ọ bula ab͕aputa ihe nime otù uzọ n'uzọ iri ihe-ya ma-ọli, otù uzọ n'uzọ ise ka ọ gātukwasi ya. Otù uzọ kwa n'uzọ iri nke ìgwè ehi na ìgwè ewu na aturu nile, ihe ọ bula nke nāgabiga n'okpuru nkpa-n'aka, otù uzọ n'uzọ iri gābu ihe nsọ diri Jehova. Ọ gaghi-etucha n'etiti ezi anumanu na anumanu ọjọ ọ gaghi-enwo kwa ya: ma ọ buru na o nwo ya ma-ọli, nke ahu di kwa nsọ ihe eji nwo ya gādi kwa nsọ; agaghi-agbnwe ya. Ndia bu ihe enyere n'iwu, nke Jehova nyere Moses n'iwu bayere umu Israel n'ugwu Sainai.

LEVITIKỌS 27:14-34 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

“ ‘Ọ bụrụ na mmadụ enye ụlọ ya, dịka ihe ga-adị nsọ nye ONYENWE ANYị, onye nchụaja ga-ekpebi maọbụ ụlọ dị mma, ma ọ bụkwanụ ụlọ jọrọ njọ. Ọ ga-ekwukwa ihe bụ ọnụahịa ụlọ ahụ. Ọ bụrụ na onye ahụ nke na-edo ụlọ ya nsọ achọọ ịgbara ya, ọ ga-akwụ ọnụahịa ụlọ ahụ, tụkwasịkwa nʼelu ya otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa ụlọ ahụ. Emesịa, ụlọ ahụ ga-abụkwa nke ya. “ ‘Ọ bụrụ na mmadụ ewere mpaghara ala ubi ezinaụlọ ya nye ONYENWE ANYị ka ihe ido nsọ, ihe a ga-eji mata ọnụahịa ala ahụ ga-abụ ụdị ihe ubi e nwere ike ịkụ nʼime ya. Ọnụahịa ala ubi e nwere ike ịkụnye ọka balị ruru otu ihe ọtụtụ homa, ga-abụ iri mkpụrụ ego ọlaọcha shekel ise. Ọ bụrụ nʼime afọ inwere onwe ka o doro ala ahụ nsọ, agaghị agbanwe ọnụahịa ya. Ma ọ bụrụ na o doro ala ahụ nsọ mgbe afọ inwe onwe ahụ gafere, onye nchụaja ga-agụkọrọ ya ọnụahịa ya dịka afọ ole ọ fọdụrụ mgbe mmemme afọ inwere onwe ọzọ ga-adị. A ga-ewebilatakwa ihe ọnụahịa ya ruru. Ọ bụrụ na onye doro ala ahụ nsọ achọọ ịgbara ala ya, ọ ga-akwụ ọnụahịa ahụ onye nchụaja kpebiri, tụkwasị ya ego ruru otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa ala ahụ. Mgbe ahụ ala ahụ ga-abụkwa nke ya. Ọ bụrụ na ọ gbapụtaghị ala ahụ, maọbụ na o resila ya onye ọzọ, a gaghị agbapụtakwa ala ahụ ọzọ. Mgbe mmemme afọ inwere onwe ruru, ala ahụ ga-aghọ ala dị nsọ, ala e doro nsọ nye ONYENWE ANYị. Ndị nchụaja ga-ewere ya ka ọ bụrụ nke ha. “ ‘Ọ bụrụ na mmadụ e doro ONYENWE ANYị ala ubi ọ zụrụ azụ nsọ, nke na-abụghị ala ezinaụlọ ha, onye nchụaja ga-agụ afọ ole ọ fọdụrụ ruo mmemme afọ inwere onwe. Ọ ga-agwa onye ahụ ego ole ọ ga-akwụ nʼihi ya. Ego ọbụla ọ kwụrụ nʼụbọchị ahụ ga-abụ ihe dị nsọ nye ONYENWE ANYị. Mgbe afọ inwere onwe ahụ zuru, onye nwe ala ahụ, ya bụ onye ahụ e si nʼaka ya zụọ ya, ga-ewerekwa ala ya. Ọnụahịa ọbụla a ga-ekpebi ga-abụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. Iri gera abụọ ga-abụ otu shekel. “ ‘A gaghị edo nwa mbụ anụmanụ mụtara nsọ maọbụ ehi maọbụ atụrụ nʼihi na ha bụ nke ONYENWE ANYị. Ọ bụrụ otu nʼime anụ ndị ahụ rụrụ arụ, a ga-agbara ya nʼọnụ ego nke akara bụ ọṅụ ahịa ya, tụkwasịkwa nʼelu ya otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa ya. Ọ bụrụkwanụ na onye nwe anụ ụlọ ahụ achọghị ịgbarakwa ya, a ga-ere ya nʼọnụ ahịa dịka o ruru. “ ‘A gaghị ere, maọbụ gbara ihe ọbụla mmadụ nwere, nke o doro nsọ nye ONYENWE ANYị, maọbụ mmadụ, maọbụ ala ezinaụlọ, maọbụ anụ ụlọ, nʼihi na ihe ọbụla nke e wezugara iche bụ ihe dịkarịsịrị nsọ nye ONYENWE ANYị. “ ‘Mgbapụta ọbụla adịghị nye onye ọbụla e doro nsọ nye mbibi. A ghaghị ime ka ọ nwụọ. “ ‘Otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ihe niile si nʼala, maọbụ mkpụrụ ọghịgha nke ubi, maọbụ mkpụrụ nke osisi mịrị, bụ nke ONYENWE ANYị. Ha bụ ihe nsọ dịrị ONYENWE ANYị. Onye ọbụla chọrọ ịgbara otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ihe ubi ya aghaghị ịkwụ ọnụahịa ya, tụkwasị ya otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa e kwesiri ire ya. Otu ụzọ nʼụzọ iri nke igwe ehi na atụrụ niile, anụ nke iri ọbụla nke na-agabiga nʼokpuru mkpanaka onye ọzụzụ atụrụ mgbe a na-agụ ha ọnụ, ga-abụ ihe dị nsọ nye ONYENWE ANYị. A gaghị ahọ anụ ụlọ a na-enye ONYENWE ANYị ahọ, ile ma ha dị mma, maọbụ na ha dị njọ. A gaghị agbanwekwa ha. Ọ bụrụ na a gbanwee ha, ndị e ji gbanwee ha na ndị a na-achọ ịgbanwe ga-aghọ ihe dị nsọ, a gaghị agbarakwa ha.’ ” Ndị a bụ iwu ONYENWE ANYị nyere Mosis nʼugwu Saịnaị ka ọ nye ụmụ Izrel.