Ọzọ, mb͕e onye ọ bula gēdo ulo-ya nsọ idiri Jehova nsọ, onye-nchu-àjà gārù kwa ya ọnu, ma ọ bu ezi ulo ma-ọbu ulo ọjọ: dika onye-nchu-àjà gārù ya ọnu, otú a ka o gēguzo. Ọ buru kwa na onye ahu nke nēdo ya nsọ ab͕aputa ulo-ya, ọ gātukwasi kwa otù uzọ n'uzọ ise nke ego ọ̀rùrù-ọnu-gi, ọ gābu kwa nke ya.
Ma ọ buru na onye ọ bula ewere ufọdu nime ala-ubi nke ihe-onwunwe-ya doro Jehova nsọ, ọ̀rùrù-ọnu-gi gādi kwa ka nkpuru-ọghigha-ya si di; otù homer nke nkpuru-ọghigha ọka barley, agārù ọnu-ya n'ọgu shekel ọla-ọcha abua na iri. Ọ buru na o sitere n'arọ jubile do ala-ubi-ya nsọ, dika ọ̀rùrù-ọnu-gi si di ka o gēguzo. Ma ọ buru na o do ala-ubi-ya nsọ mb͕e jubile gasiri, onye-nchu-àjà gāgu-kwa-ra ya ego-ya dika arọ fọduru iru arọ jubile si di, agāgubì kwa ihe n'ọ̀rùrù-ọnu-gi. Ma ọ buru na onye ahu nke nēdo ala-ubi nsọ ab͕aputa ya n'ezie, ọ gātukwasi kwa ya otù uzọ n'uzọ ise nke ego ọ̀rùrù-ọnu-gi, agēme kwa ka o guzosiere ya ike. Ma ọ buru na ọ b͕aputaghi ala-ubi ahu, ma-ọbu na ọ renyewo onye ọzọ ala-ubi ahu, agaghi-ab͕aputa ya ọzọ: ma ala-ubi ahu, n'òpùpù-ya nime jubile, gādiri Jehova nsọ, dika ala-ubi nke ewezugara ka ebibie ya; onye-nchu-àjà gēnwe ihe-onwunwe ala-ubi ahu. Ma ọ buru na o doro Jehova ala-ubi ọ zuworo nsọ, bú nke nēsiteghi n'ala-ubi nke ihe-onwunwe-ya; onye-nchu-àjà gāgu-kwa-ra ya ọgugu nke ọ̀rùrù-ọnu-gi rue arọ jubile: ọ gēnye kwa ọ̀rùrù-ọnu-gi n'ubọchi ahu, dika ihe nsọ diri Jehova. N'arọ jubile ala-ubi ahu gālaghachiri onye azutara ya n'aka-ya, bú onye nwe ihe-onwunwe nke ala ahu. Ọ̀rùrù-ọnu-gi nile gādi kwa ka shekel nke ebe nsọ si di: orú gerah gābu shekel ahu.
Nání nwa eburu uzọ mu n'etiti anu-ulo, nke anēme ka ọ buru nwa eburu uzọ muru Jehova, ọ dighi onye ọ bula gēdo ya nsọ: ma ọ bu ehi ma-ọbu aturu, ihe Jehova nwere ka ọ bu. Ma ọ buru na ọ di n'etiti anu-ulo ruru árú, ọ gāb͕aputa kwa ya dika ọ̀rùrù-ọnu-gi si di, ọ gātukwasi kwa ya otù uzọ n'uzo ise ya: ma ọ buru na ab͕aputaghi ya, agēre kwa ya dika ọ̀rùrù-ọnu-gi si di.
Nání, ọ dighi ihe ọ bula agēre ma-ọbu b͕aputa, nke ewezugara ka ebibie ya, nke onye ọ bula gēwezugara Jehova ka ebibie ya, site n'ihe nile o nwere, site na madu na anu-ulo, ma-ọbu site n'ala-ubi nke ihe-onwunwe-ya: ihe ọ bula ewezugara ka ebibie ya, ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ buru Jehova. Ọ dighi onye ọ bula agāb͕aputa, nke ewezugara ka ebibie ya, nke agēwezuga ka ebibie ya site n'etiti madu: aghaghi ime ka ọ nwua.
Otù uzọ n'uzọ iri ihe nile nke ala, site na nkpuru-ọghigha nke ala, ma ọbu site na nkpuru osisi, ihe Jehova nwere ka ọ bu: ọ bu ihe nsọ diri Jehova. Ma ọ buru na onye ọ bula ab͕aputa ihe nime otù uzọ n'uzọ iri ihe-ya ma-ọli, otù uzọ n'uzọ ise ka ọ gātukwasi ya. Otù uzọ kwa n'uzọ iri nke ìgwè ehi na ìgwè ewu na aturu nile, ihe ọ bula nke nāgabiga n'okpuru nkpa-n'aka, otù uzọ n'uzọ iri gābu ihe nsọ diri Jehova. Ọ gaghi-etucha n'etiti ezi anumanu na anumanu ọjọ ọ gaghi-enwo kwa ya: ma ọ buru na o nwo ya ma-ọli, nke ahu di kwa nsọ ihe eji nwo ya gādi kwa nsọ; agaghi-agbnwe ya.
Ndia bu ihe enyere n'iwu, nke Jehova nyere Moses n'iwu bayere umu Israel n'ugwu Sainai.